Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 27:1-15 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e ekpebìri na ayi gābà n'ub͕ọ je Itali, ha we rara Pọl na ufọdu ndi-nkpọrọ ọzọ nye n'aka ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, aha-ya bu Juliọs, nke òtù ndi-agha Ọgustọs.

2. Ayi we ba n'ub͕ọ Adramitiọm, nke gaje iga ebe di n'usọ oké osimiri nke Esia, we nupu, Aristakọs, onye Masedọnia nke Tesalọnaika, soro kwa ayi.

3. Ubọchi soni ayi we rue ala na Saidon: Juliọs we were obi-ọma mezie Pọl, kwere ka o jekuru ndi-eyì-ya ka ewe le ya anya nke-ọma.

4. Ayi we si n'ebe ahu nupu ub͕ọ, we nāga ala Saiprọs nso, n'ihi na ifufe nēfegide ayi.

5. Mb͕e ayi gabigasiri oké osimiri nke di n'akuku Silisia na Pamfilia, ayi we rue Maira, obodo nke Lisia.

6. N'ebe ahu ka ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise huru ub͕ọ Aleksandria nke nēje Itali; o we me ka ayi ba nime ya.

7. Mb͕e ayi gasiri nwayọ ọtutu ubọchi, mb͕e ọ di kwa ayi ike iru na ncherita-iru Naidọs, ebe ifufe nēkweghi ka ayi ga n'iru ọzọ, ayi we nāga ala Krit nso, na ncherita-iru Salmoni;

8. o we di ayi ike iga n'akuku ya, ayi we rue otù ebe anākpọ Ọnu-miri Ọma; nke obodo Lasia di ya nso.

9. Ma mb͕e o ruru ọtutu oge, mb͕e ije-ub͕ọ di kwa egwu ub͕u a, n'ihi na ub͕u a ka oge Obubu-ọnu gasiri, Pọl we dọ ha aka na nti,

10. si ha, Ndikom, ahuwom na nbibi na oké iyì gaje idi n'ije-ub͕ọ a, ọ bughi nání nke ihe ub͕ọ nēbu na ub͕ọ onwe-ya, ma nke ndu-ayi kwa.

11. Ma ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise kweyere onye-isi ub͕ọ na onye nwe ub͕ọ, kari okwu Pọl kwuru.

12. Ebe ọnu-miri ahu nādighi n'ebe di nma inogide na mb͕e oyi, ndi ka n'ọnu-ọgugu nime ha we du ọdú ka enupu ub͕ọ n'ebe ahu, ma eleghi anya ha gēru Finiks, we nọgide n'ebe ahu na mb͕e oyi; nke bu otù ọnu-miri nke Krit, nke nēche iru n'Ọwuwa-anyanwu n'akuku Ugwu na akuku Ndida.

13. Mb͕e ifufe nēfe nwayọ, ebe ha chère na ihe ha nēzube eruwo ha aka, ha we pua nāga n'akuku Krit.

14. Ma mb͕e ogologo oge akāgaghi, oké ifufe jọb͕uru onwe-ya nke anākpọ Yurakwilo, we si n'ebe ahu fedata:

15. mb͕e ifufe ahu napuru ayi ub͕ọ, mb͕e ub͕ọ apughi kwa ichegide ifufe ahu, ayi we rapu aka, ewe nēfeghari ayi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 27