Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 24:23-27 Bible Nso (IGBOB)

23. O we nye ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise iwu ka edebe ya, ka eme kwa ka ihe diri ya nfé; ka aghara kwa ib͕ochi onye ọ bula nime ndi nke aka ya ijere ya ozi.

24. Ma mb͕e ubọchi ufọdu gasiri Filiks biaruru, ya na Drusila, nwunye nke aka ya, onye bu nwanyi Ju, o we kpọta Pọl, we nu okwu-ya bayere okwukwe nime Kraist Jisus.

25. Mb͕e ọ nēkwu okwu bayere ezi omume, na imerū ihe okè, na ikpé ahu nke gaje ibia, Filiks we tua egwu, o we za, si, Ga nke gi n'oge a; mb͕e m'nwere oge m'gākpọ kwa gi.

26. O nēle kwa anya na Pọl gēnye ya ego: n'ihi ya ọ nākpọta kwa ya ọtutu mb͕e, ya na ya nākparita kwa uka.

27. Ma mb͕e arọ abua b͕azuru, Pọsiọs Festọs nọchiri ọnọdu Filiks; ebe ọ nāchọ inwe iru-ọma n'ebe ndi-Ju nọ, Filiks we rapu Pọl n'ab͕u.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 24