Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 2:2-11 Bible Nso (IGBOB)

2. Na mberede ùzù, dika nke oké ifufe nke nēfesi ike, we site n'elu-igwe, o we juputa ulo ahu dum ebe ha nānọdu ala.

3. Ewe me ka ha hu ire, dika nke ọku, nēkesa onwe-ha; o we nọkwasi ha nile n'otù n'otù.

4. Ha nile we juputa na Mọ Nsọ, ha we malite ikwu okwu n'asusu di iche, dika Mọ ahu nēnye ha ike ikwuwa okwu.

5. Ma ndi-Ju ufọdu bi na Jerusalem, ndi nātu egwu Chineke, ndi si na mba nile di n'okpuru elu-igwe bia.

6. Ma mb͕e ùzù ahu putura, ọra madu b͕akọrọ, o we b͕a ha ghari, n'ihi na onye ọ bula n'etiti ha nānu ka ha nēkwu okwu n'asusu nke aka ya.

7. Ibobo we nwua ha nile n'aru, o ju-kwa-ra ha anya, ha si, Le, ndia nile ndi nēkwu okwu, hà abughi ndi Galili?

8. Àyi onwe-ayi si kwa aṅa nu n'otù n'asusu nke aka ayi, nke amuru ayi nime ya?

9. Ndi Patia na ndi Midia na ndi Ilam, na ndi bi na Mesọ-pọtemia, ndi bi kwa nime Judia na Kapa-dọsia, nime Pọntọs na Esia,

10. nime Frijia na Pamafilia, nime Ijipt na akuku Libia di Sairini nso, na ndi-ọbìa si na Rom bia, ma ndi-Ju ma ndi nēso uzọ ndi-Ju,

11. ndi Krit na ndi Arebia, ayi nānu ka ha nēkwu okwu n'asusu-ayi bayere oké ọlu nile nke Chineke.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 2