38. Ya mere ọ buru na Dimitriọs, na ndi-ọ̀kà ndi soro ya, nwere okwu megide onye ọ bula, anēdebe ubọchi ikpé, ndi-isi nọ kwa: ka ha borita onwe-ha ebubo.
39. Ma ọ buru na unu nāchọ ihe ọ bula bayere okwu di iche, agēdozi ya na nzukọ ahu nke ziri ezi n'iwu.
40. N'ihi na ayi nọ n'ihe-ize-ndu na agēji ihe mere ta bo ayi ebubo na ayi biliri megide ndi-isi, ebe ọ nādighi ihe wetara ya: n'ihi ya ayi agaghi-apu kwa iza ajuju bayere nb͕akọ a.
41. Mb͕e o kwusiri okwu ndia, o we zilaga nzukọ ahu.