Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 19:2-18 Bible Nso (IGBOB)

2. o we si ha, Ùnu natara Mọ Nsọ mb͕e unu kwere? Ha si ya, É-è, kama ayi anughi ọbuná ma enyere Mọ Nsọ.

3. O we si, Ọ̀ bu ibà nime gini kwa ka emere unu baptism? Ha we si, Ibà nime baptism nke Jọn.

4. Pọl we si, Jọn ji baptism nke nchèghari eme baptism, nāsi ndi-Ju ka ha kwere n'Onye ahu Nke gaje ibia n'azu ya, nke ahu bu, na Jisus.

5. Mb͕e ha nuru nka, ewe me ha baptism ibà n'aha Onye-nwe-ayi Jisus.

6. Mb͕e Pọl bikwasisiri ha aka-ya abua n'isi, Mọ Nsọ we biakwasi ha; ha we kwue okwu n'asusu di iche iche ọzọ, bu kwa amuma.

7. Ha nile ra ka ndikom iri na abua.

8. O we ba n'ulo-nzukọ-ha, we nēkwuwa okwu ogologo ọnwa atọ, nāgwa ha okwu n'ihe nile bayere ala-eze Chineke, nēme kwa ka ha kweye ha.

9. Ma mb͕e obi madu ufọdu mere etili, mb͕e ha ghara kwa ikweye, nēkwu ihe ọjọ bayere Uzọ Jisus n'iru ọra madu, o we si n'ebe ha nọ pua, kewapu ndi nēso ụzọ Jisus, nēkwu okwu kwa-ubọchi n'ulo-akwukwọ Tiranọs.

10. Ewe nēme nka ogologo arọ abua; ya mere ndi nile ndi bi n'Esia nuru okwu Onye-nwe-ayi, ma ndi-Ju ma ndi-Grik.

11. Chineke nālu kwa ọlu di ike site n'aka Pọl dika anāhughi mb͕e ọ bula:

12. ya mere anēsi n'aru-ya wetara ndi aru-ha nādighi ike ichafọ ma-ọbu ákwà apron, ọria-ha we la n'aru-ha, ajọ mọ nile aputa kwa.

13. Ma ufọdu nime ndi-Ju ndi nējeghari, bú ndi si na ha nāchupu ndi ajọ mọ, tiye-kwa-ra-aka-ha ikpọkwasi aha Onye-nwe-ayi Jisus n'isi ndi nwere ajọ mọ ahu, nāsi, Ewerem Jisus Onye Pọl nēkwusa b͕a unu iyi.

14. Umu-ndikom asa nke otù onye-Ju, anākpọ Skiva, bú onye-isi-nchu-àjà, di, ndi mere nka.

15. Ajọ mọ ahu we za, si ha, Jisus ka m'matara, ama-kwa-ram Pọl; ma ùnu onwe-unu bu ole ndi?

16. Nwoke ahu onye ajọ mọ di nime ya we wukwasi ha, karia ha abua, o nwe-kwa-ra ike n'aru-ha, ya mere ha si n'ulo ahu b͕apu, b͕ara ọtọ, emeru kwa ha aru.

17. Ewe me ka ndi nile ndi bi n'Efesọs, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, mara nka; ha nile we tua egwu, eme-kwa-ra aha Onye-nwe-ayi Jisus ka ọ di uku.

18. Ọtutu madu n'etiti ndi kwereri na Jisus bia-kwa-ra, nēkwuputa, nākọ kwa ihe nile ha nēme.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 19