Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 17:17-31 Bible Nso (IGBOB)

17. Ya mere ọ nāgwa ndi-Ju na ndi nātu egwu Chineke okwu n'ulo-nzukọ, ọ nāgwa kwa ndi ọ nēzute n'ọma-ahia okwu kwa-ubọchi.

18. Ufọdu kwa nime ndi-Epikurean na ndi-Stoik, bú ndi nāhu amam-ihe n'anya, we zute ya. Ufọdu we si, Gini ka onye-ekwukwu a nāchọ ikwu? ndi ọzọ nāsi kwa, Ọ di ka onye nēkwusa ndi-mọ nke ala ọzọ: n'ihi na ọ nēzisa ozi ọma nke Jisus na nbilite-n'ọnwu-Ya.

19. Ha we jide ya, kuru ya je n'iru Areọpagọs, si, Àyi puru ima ihe ozizí ọhu nka bu, nke i nēkwu?

20. N'ihi na i nēweta na nti-ayi ihe ufọdu nke ala ọzọ: ya mere ayi nēzube ima isi ihe ndia.

21. (Ma ndi Atens nile na ndi ala ọzọ ndi nọ dika ọbìa n'ebe ahu enweghi oghere ime ihe ọzọ di iche, ma-ọbughi ikwu ma-ọbu inu ihe dikariri ọhu.)

22. Pọl we guzo n'etiti Areọpagọs, si,Ndikom nke Atens, n'ihe nile ahuwom na unu nāsọpuru ndi-mọ-unu nke-uku.

23. N'ihi na mb͕e m'nāgabiga, nēkiri kwa ihe di iche iche unu nāsọpuru, m'we hu otù ebe-ichu-àjà nke edekwasiri ihe a n'elu ya, ENYERE CHI NKE ANĀMAGHI AMA. Ya mere ihe unu nāsọpuru nāmaghi ama, nka ka mu onwem nēkwusara unu.

24. Chineke Onye kère uwa na ihe nile di nime ya, ebe Ọ bu Onye-nwe elu-igwe na ala, Ya onwe-ya adighi-ebi n'ulo nsọ eji aka wu;

25. ejighi kwa aka madu jere ya ozi, dika o nwere ihe ọ bula di Ya nkpà, ebe Ya onwe-ya nēnye madu nile ndu, na ume, na ihe nile;

26. O we site n'otù onye kè mba nile n'otù n'otù nke madu, ka ha biri n'elu uwa nile, mb͕e O debesiri oge-ha akaworo àkà na ókè nile nke ebe-obibi-ha;

27. ka ha we chọ Chineke, ma eleghi anya ha gāsọ ìsì, we chọta Ya, ọ bu ezie na Ọ nọghi n'ebe di anya n'aru onye ọ bula nime ayi:

28. n'ihi na ọ bu nime Ya onwe-ya ka ayi nādi ndu, nējeghari kwa, nādi kwa; dika ufọdu ọbuná nime ndi nke unu ndi nēme abù kwuworo, si, N'ihi na ayi bu kwa ndi Ọ muru.

29. Ya mere ebe ayi bu ndi Chineke muru, o kwesighi ka ayi nēchè na Ihe akpọrọ Chineke yiri ọla-edo, ma-ọbu ọla-ọcha, ma-ọbu nkume, ihe apiri api site na ǹkà na ihe di n'obi madu.

30. Ya mere Chineke lefuru oge nile nke amaghi-ihe anya; ma ub͕u a Ọ nāgwa madu ka ha nile chègharia n'ebe nile:

31. ebe O debeworo otù ubọchi, nke Ọ gēkpe elu-uwa dum madu bi ikpé n'ezi omume nime ya site n'aka otù Nwoke Ọ kara àkà; O nye-kwa-ra madu nile ihe ha gēji kwere nka, ebe Ọ mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 17