Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 16:33-39 Bible Nso (IGBOB)

33. O we kuru ha n'otù oge hour nke abali ahu, sa ọnyá ihe-otiti-ha; ngwa ngwa ewe me ya baptism, ya onwe-ya na ndi-ya nile.

34. O we kugo ha n'ulo-ya, dọba ihe-oriri n'iru ha, obi nātọ kwa ya utọ nke-uku, ya na èzí-na-ulo-ya nile, ebe o kwere Chineke.

35. Ma mb͕e chi bọrọ, ndi-ikpé zitere ndi-ọchi-utari-ha, si, Rapu ndikom ahu ka ha la.

36. Onye-nche ulo-nkpọrọ ahu we kọrọ Pọl okwu ndia, si, Ndi-ikpé ezitewo ka arapu unu la: ya mere putanu ub͕u a, la kwa n'udo.

37. Ma Pọl siri ha, Ha piara ayi ihe n'iru ọra madu, nāmaghi ayi ikpé, ọ bu ezie na ayi bu ndi Rom, ha we tubà ayi n'ulo-nkpọrọ; hà nāchupu kwa ayi ub͕u a na nzuzo? ha agaghi-eme ya ma-ọli; kama ka ha onwe-ha bia duputa ayi.

38. Ndi-ọchi-utari ahu we kọrọ ndi-ikpé okwu ndia: ha we tua egwu, mb͕e ha nuru na ha bu ndi Rom;

39. ha we bia riọ ha; mb͕e ha duputasiri ha, ha we kpere ha ka ha si n'obodo-ha pua.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 16