Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 16:28-36 Bible Nso (IGBOB)

28. Ma Pọl were oké olu ti nkpu, si, Emerula onwe-gi aru: n'ihi na ayi nile nọ n'ebe a.

29. O we riọ ka eweta ọku, o we mabà nime, da n'iru Pọl na Sailas, ka aru nāma ya jijiji,

30. o we kuputa ha, si, Ndi-nwe-ayi, gini di nkpà ka m'me ka ewe zọputam?

31. Ha we si, Kwere n'Onye-nwe-ayi Jisus, agāzọputa kwa gi, gi onwe-gi na èzí-na-ulo-gi.

32. Ha we gwa ya okwu Onye-nwe-ayi, ya na ndi nile nọ n'ulo-ya.

33. O we kuru ha n'otù oge hour nke abali ahu, sa ọnyá ihe-otiti-ha; ngwa ngwa ewe me ya baptism, ya onwe-ya na ndi-ya nile.

34. O we kugo ha n'ulo-ya, dọba ihe-oriri n'iru ha, obi nātọ kwa ya utọ nke-uku, ya na èzí-na-ulo-ya nile, ebe o kwere Chineke.

35. Ma mb͕e chi bọrọ, ndi-ikpé zitere ndi-ọchi-utari-ha, si, Rapu ndikom ahu ka ha la.

36. Onye-nche ulo-nkpọrọ ahu we kọrọ Pọl okwu ndia, si, Ndi-ikpé ezitewo ka arapu unu la: ya mere putanu ub͕u a, la kwa n'udo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 16