Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 16:21-31 Bible Nso (IGBOB)

21. ha nēkwusa kwa ọme-n'ala nke nēzighi ezi n'iwu ka ayi nara, ma-ọbu ime, ebe ayi bu ndi Rom.

22. Ìgwè ndi ahu we guzo ọtọ n'otù imegide ha: ndi-ikpé we dọwapu uwe-ha, nye kwa iwu ka apia ha utari.

23. Mb͕e ha tisiri ha ọtutu ihe-otiti, ha tubà ha n'ulo-nkpọrọ, nēnye onye-nche ulo-nkpọrọ iwu ka ọ debe ha nke-ọma:

24. onye, ebe enyere ya-ri iwu di otú a, ọ tubàra ha nime ulo-nkpọrọ di nime, kpọsie ha ọtọsi ike n'ukwu.

25. Ma dika n'etiti abali Pọl na Sailas nēkpe ekpere nābùku kwa Chineke abù, ndi-nkpọrọ we nēge nti n'olu-ha;

26. na mberede oké ala-ọma-jijiji di, nke mere ka ntọ-ala ulo-nkpọrọ ma jijiji: ngwa ngwa ọnu-uzọ nile we meghe; ab͕u ndi-nkpọrọ nile tọpu-kwa-ra.

27. Onye-nche ulo-nkpọrọ, ebe emere ka ọ teta n'ura, ebe ọ hu-kwa-ra ọnu-uzọ ulo-nkpọrọ ka ha megheworo, o we miputa mma-agha-ya, gaje ib͕u onwe-ya, ebe ọ nēchè na ndi-nkpọrọ ab͕apuwori.

28. Ma Pọl were oké olu ti nkpu, si, Emerula onwe-gi aru: n'ihi na ayi nile nọ n'ebe a.

29. O we riọ ka eweta ọku, o we mabà nime, da n'iru Pọl na Sailas, ka aru nāma ya jijiji,

30. o we kuputa ha, si, Ndi-nwe-ayi, gini di nkpà ka m'me ka ewe zọputam?

31. Ha we si, Kwere n'Onye-nwe-ayi Jisus, agāzọputa kwa gi, gi onwe-gi na èzí-na-ulo-gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 16