30. Ya mere, mb͕e ezipusiri ha, ha ridatara n'Antiọk; mb͕e ha mesiri ka ọra madu zukọ, ha nye ha akwukwọ-ozi ahu.
31. Mb͕e ha gusiri ya, ha ṅuria n'ihi nkasi-obi di ya.
32. Judas na Sailas, ebe ha onwe-ha bu kwa ndi-amuma, ha we were ọtutu okwu kasie umu-nna ahu obi, me kwa ka obi-ha guzosie ike.
33. Mb͕e ha nọdusiri n'ebe ahu oge ufọdu, ewe si n'ebe umu-nna ahu nọ zilaga ha n'udo lakuru ndi ziputara ha-ri.
34. Ma otú ọ di, ọ di Sailas nma ka ọ nọgide n'ebe ahu.
35. Ma Pọl na Banabas nọgidere n'Antiọk, nēzí nēzisa kwa ozi ọma, bú okwu nke Onye-nwe-ayi, ha na ọtutu ndi ọzọ kwa.
36. Mb͕e ubọchi ufọdu gasiri Pọl we si Banabas, Ka ayi jeghachi ub͕u a leta umu-nna-ayi n'obodo nile n'otù n'otù ebe ayi kwusara okwu Onye-nwe-ayi, ka ayi we le otú ha nēme.