Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 15:27-41 Bible Nso (IGBOB)

27. Ya mere ayi ezitewo Judas na Sailas, ndi ha onwe-ha gākọ-kwa-ra unu otù ihe ndia n'okwu ọnu.

28. N'ihi na ọ di Mọ Nsọ nma, di kwa ayi onwe-ayi nma, ka ayi ghara ibo unu ibu arọ́ kari ihe ndia di nkpà:

29. ka unu rapu ihe nile achuru n'aja nye arusi, na ọbara, na anu anyab͕uru anyab͕u, na ikwa-iko; ọ buru na unu edebe onwe-unu ghara imetu ihe ndia aka, ọ gādiri unu nma. Jisienu ike.

30. Ya mere, mb͕e ezipusiri ha, ha ridatara n'Antiọk; mb͕e ha mesiri ka ọra madu zukọ, ha nye ha akwukwọ-ozi ahu.

31. Mb͕e ha gusiri ya, ha ṅuria n'ihi nkasi-obi di ya.

32. Judas na Sailas, ebe ha onwe-ha bu kwa ndi-amuma, ha we were ọtutu okwu kasie umu-nna ahu obi, me kwa ka obi-ha guzosie ike.

33. Mb͕e ha nọdusiri n'ebe ahu oge ufọdu, ewe si n'ebe umu-nna ahu nọ zilaga ha n'udo lakuru ndi ziputara ha-ri.

34. Ma otú ọ di, ọ di Sailas nma ka ọ nọgide n'ebe ahu.

35. Ma Pọl na Banabas nọgidere n'Antiọk, nēzí nēzisa kwa ozi ọma, bú okwu nke Onye-nwe-ayi, ha na ọtutu ndi ọzọ kwa.

36. Mb͕e ubọchi ufọdu gasiri Pọl we si Banabas, Ka ayi jeghachi ub͕u a leta umu-nna-ayi n'obodo nile n'otù n'otù ebe ayi kwusara okwu Onye-nwe-ayi, ka ayi we le otú ha nēme.

37. Banabas we zube ikuru kwa Jọn, onye anākpọ Mark, ka ya na ha yikọ je.

38. Ma ọ dighi Pọl nma ka ha kuru onye ahu ka ya na ha yikọ je, bú onye si na Pamfilia rapu ha laghachi, ghara iso kwa ha je ọlu-ha.

39. Oké iwe we puta n'etiti ha, nke mere ka ha kewa otù onye n'ebe ibe-ya nọ, Banabas we kuru Mark nye onwe-ya, we ba n'ub͕ọ je Saiprọs;

40. ma Pọl rọputara Sailas, we pua, mb͕e umu-nna nime Kraist rarasiri ya nye n'amara Onye-nwe-ayi.

41. O we gabiga nime Siria na Silisia, nēme ka nzukọ Kraist guzosie ike.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 15