23. ha site-kwa-ra n'aka-ha de akwukwọ, si, Ndi-ozi na umu-nna-unu, bú ndi-okenye, nēdegara umu-nna-ayi akwukwọ, bú ndi sitere na ndi mba ọzọ, ndi bi n'Antiọk na Siria na Silisia, ayi nēkele unu:
24. Ebe ayi nuru na ufọdu ndi siri n'etiti ayi pua were okwu me ka obi lọ unu miri, nēmebi nkpuru-obi-unu; bú ndi ayi nēnyeghi ihe ọ bula n'iwu;
25. ọ di ayi nma, ebe ayi biaworo nwe otù obi, irọputa ndikom na iwere ha zigara unu, ha na Banabas na Pọl, ndi ayi huru n'anya,
26. ndi raraworo ndu-ha nye n'ihi aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.
27. Ya mere ayi ezitewo Judas na Sailas, ndi ha onwe-ha gākọ-kwa-ra unu otù ihe ndia n'okwu ọnu.
28. N'ihi na ọ di Mọ Nsọ nma, di kwa ayi onwe-ayi nma, ka ayi ghara ibo unu ibu arọ́ kari ihe ndia di nkpà:
29. ka unu rapu ihe nile achuru n'aja nye arusi, na ọbara, na anu anyab͕uru anyab͕u, na ikwa-iko; ọ buru na unu edebe onwe-unu ghara imetu ihe ndia aka, ọ gādiri unu nma. Jisienu ike.
30. Ya mere, mb͕e ezipusiri ha, ha ridatara n'Antiọk; mb͕e ha mesiri ka ọra madu zukọ, ha nye ha akwukwọ-ozi ahu.
31. Mb͕e ha gusiri ya, ha ṅuria n'ihi nkasi-obi di ya.
32. Judas na Sailas, ebe ha onwe-ha bu kwa ndi-amuma, ha we were ọtutu okwu kasie umu-nna ahu obi, me kwa ka obi-ha guzosie ike.