Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 13:43-52 Bible Nso (IGBOB)

43. Ma mb͕e nzukọ ahu lasasiri, ọtutu madu n'etiti ndi-Ju, na n'etiti ndi nēso uzọ ndi-Ju ndi nātu egwu Chineke, soro Pọl na Banabas: ndi nāgwa ha okwu, nēme kwa ha ka ha kweye inọgide n'amara nke Chineke.

44. Ma n'ubọchi-izu-ike soni ọ fọduru ihe ntà ka obodo ahu nile zukọ inu okwu Chineke.

45. Ma mb͕e ndi-Ju huru ìgwè madu ahu, ha juputara n'ekworo, we nēkwugide ihe nile Pọl nēkwu, ha nēkwulu kwa ha.

46. Pọl na Banabas we kwuwa okwu, si, Ọ di nkpà ka eburu uzọ gwa unu okwu Chineke. Ebe unu nēnupu ya n'aru-unu, nekpe kwa onwe-unu ndi nēkwesighi ndu ebighi-ebi, le, ayi gaje ichighari gwa ndi mba ọzọ okwu.

47. n'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi nyeworo ayi iwu, si,Edebewom I ka I buru ìhè nke mba nile,Ka I we di inye nzọputa rue nsọtu uwa.

48. Ma mb͕e ndi mba ọzọ nuru nka, ha ṅuria, nye kwa okwu Chineke otuto: ha we kwere na Jisus, ka ha ra, bú ndi edoro inata ndu ebighi-ebi.

49. Ewe nēbu okwu Onye-nwe-ayi jezu ala ahu dum.

50. Ma ndi-Ju kwaliri ndinyom nātu egwu Chineke, bú ndi anāsọpuru, na ndi-isi obodo ahu, ha we kpalie nsob͕u megide Pọl na Banabas, we chupu ha n'ókè-ala-ha.

51. Ma ha rupuru ájá nke ukwu-ha megide ha, we bia rue Aikọniọm.

52. Ndi nēso uzọ Jisus we juputa n'ọṅù na Mọ Nsọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 13