Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 13:41-43 Bible Nso (IGBOB)

41. Lenu, ndi-nlelì-anya, ka o ju kwa unu anya, ka ekpochapu kwa unu;N'ihi na ọlu ka Mu Onwem nālu n'ubọchi-unu,Ọlu unu nāgaghi-ekwe ma-ọli ọ buru na onye ọ bula kọrọ unu akukọ-ya.

42. Mb͕e ha nāpu, ha we riọ ka agwa ha okwu ndia n'ubọchi-izu-ike soni.

43. Ma mb͕e nzukọ ahu lasasiri, ọtutu madu n'etiti ndi-Ju, na n'etiti ndi nēso uzọ ndi-Ju ndi nātu egwu Chineke, soro Pọl na Banabas: ndi nāgwa ha okwu, nēme kwa ha ka ha kweye inọgide n'amara nke Chineke.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 13