Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 13:33-42 Bible Nso (IGBOB)

33. na Chineke emezuwo nka n'ebe umu-ayi nọ, ebe O mere ka Jisus bilie; dika edewo-kwa-ra ya n'abù ọma nke-abua, si, Ọkparam ka Gi onwe-gi bu, Mu onwem amuwo Gi ta.

34. Ma na O mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ọ dighi na Ọ gaje ilaghachi n'ire-uré ọzọ, O kwuwo otú a, si, M'gēnye unu ihe nile di ọcha nke kwesiri ntukwasi-obi nke ekwere Devid na nkwa.

35. N'ihi na Ọ nāsi kwa n'abù ọma di iche, I gaghi-enye Onye nke Gi di ọcha n'obi ka Ọ hu ire-uré.

36. N'ihi na Devid, mb͕e o jesiri ọb͕ọ-ya ozi, o sitere n'ìzù Chineke da n'ura ọnwu, ewe tọb͕ọ ya n'ebe nna-ya-hà nọ, o we hu ire-uré:

37. ma Onye ahu Chineke mere ka O bilie ahughi ire-uré.

38. Ya mere maranu nka, umu-nnem, na anēsite n'ọnu Onye a kwusa nb͕aghara nmehie nile nye unu:

39. ọ bu kwa nime Onye a ka anāgu onye ọ bula nke kwere na Ya n'onye ezi omume n'ihe nile, nke anāpughi igu unu na ndi ezi omume na ha nime iwu Moses.

40. Ya mere lezienu anya, ka ihe ahu ghara ibiakwasi unu, nke ekwuworo n'akwukwọ ndi-amuma, si,

41. Lenu, ndi-nlelì-anya, ka o ju kwa unu anya, ka ekpochapu kwa unu;N'ihi na ọlu ka Mu Onwem nālu n'ubọchi-unu,Ọlu unu nāgaghi-ekwe ma-ọli ọ buru na onye ọ bula kọrọ unu akukọ-ya.

42. Mb͕e ha nāpu, ha we riọ ka agwa ha okwu ndia n'ubọchi-izu-ike soni.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 13