Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 10:20-27 Bible Nso (IGBOB)

20. Ma bilie, rida, so ha ga, enweghi uche abua: n'ihi na Mu onwem ezitewo ha.

21. Pita we ridakuru ndikom ahu, si, Le, mu onwem bu onye unu nāchọ: gini bu ihe unu biaworo n'ihi ya?

22. Ha we si, Kọniliọs ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, nwoke bu onye ezi omume nke nātu kwa egwu Chineke, onye mba ndi-Ju dum nāb͕a-kwa-ra ya ezi àmà, ya ka mọ-ozi nke di nsọ duru ọdú site na Chineke, ikpọta gi n'ulo-ya, na inu okwu ufọdu si gi n'ọnu puta.

23. Ya mere ọ kpọbatara ha, le ha ọbìa.Ma n'echi-ya o bilie so ha pua, ufọdu nime umu-nna nime Kraist, bú ndi Jọpa, so-kwa-ra ya je.

24. N'echi-ya ha ba nime Sisaria. Ma Kọniliọs nēle anya ha, ọ kpọkọ-kwa-rari ndi-ikwu-ya na ndi-eyì-ya ọ huru n'anya.

25. Ma mb͕e o ruru na Pita batara, Kọniliọs zutere ya, da n'ala n'ukwu-ya, kpọ isi ala nye ya.

26. Ma Pita weliri ya elu, si, Bilie; mu onwem bu kwa madu.

27. Ka ya na ya nākparita uka, ọ ba nime, hu ọtutu madu ndi b͕akọrọri:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 10