Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 10:18-29 Bible Nso (IGBOB)

18. we kpọ jua ma Saimon, onye anākpọ kwa Pita, nānọ dika ọbìa n'ebe ahu.

19. Ma mb͕e ọhù ahu nādi n'obi Pita, Mọ Nsọ siri ya, Le, ndikom atọ nāchọ gi.

20. Ma bilie, rida, so ha ga, enweghi uche abua: n'ihi na Mu onwem ezitewo ha.

21. Pita we ridakuru ndikom ahu, si, Le, mu onwem bu onye unu nāchọ: gini bu ihe unu biaworo n'ihi ya?

22. Ha we si, Kọniliọs ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, nwoke bu onye ezi omume nke nātu kwa egwu Chineke, onye mba ndi-Ju dum nāb͕a-kwa-ra ya ezi àmà, ya ka mọ-ozi nke di nsọ duru ọdú site na Chineke, ikpọta gi n'ulo-ya, na inu okwu ufọdu si gi n'ọnu puta.

23. Ya mere ọ kpọbatara ha, le ha ọbìa.Ma n'echi-ya o bilie so ha pua, ufọdu nime umu-nna nime Kraist, bú ndi Jọpa, so-kwa-ra ya je.

24. N'echi-ya ha ba nime Sisaria. Ma Kọniliọs nēle anya ha, ọ kpọkọ-kwa-rari ndi-ikwu-ya na ndi-eyì-ya ọ huru n'anya.

25. Ma mb͕e o ruru na Pita batara, Kọniliọs zutere ya, da n'ala n'ukwu-ya, kpọ isi ala nye ya.

26. Ma Pita weliri ya elu, si, Bilie; mu onwem bu kwa madu.

27. Ka ya na ya nākparita uka, ọ ba nime, hu ọtutu madu ndi b͕akọrọri:

28. o we si ha, Unu onwe-unu mara otú ọ bu ihe nēzighi ezi n'iwu ka nwoke nke bu onye-Ju were onwe-ya rapara n'aru onye mba ọzọ ma-ọbu ijekuru ya; otú ọ di, mu onwem ka Chineke gosiri ka m'ghara ikpọ madu ọ bula ihe ruru árú ma-ọbu ihe nādighi ọcha:

29. n'ihi nka ka m'bia-kwa-ra nārugharighi uka, mb͕e eji kpọtam. Ya mere anamaju, Òkwu gini mere unu ji kpọtam?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 10