Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 10:17-23 Bible Nso (IGBOB)

17. Ma mb͕e Pita nēnwe obi abua nime onwe-ya ihe ọ gābu, bú ọhù ọ hururi, le, ndikom ahu ndi Kọniliọs zitereri, ebe ha jusiri ajuju ulo Saimon, ha guzoro n'ọnu-uzọ-ama,

18. we kpọ jua ma Saimon, onye anākpọ kwa Pita, nānọ dika ọbìa n'ebe ahu.

19. Ma mb͕e ọhù ahu nādi n'obi Pita, Mọ Nsọ siri ya, Le, ndikom atọ nāchọ gi.

20. Ma bilie, rida, so ha ga, enweghi uche abua: n'ihi na Mu onwem ezitewo ha.

21. Pita we ridakuru ndikom ahu, si, Le, mu onwem bu onye unu nāchọ: gini bu ihe unu biaworo n'ihi ya?

22. Ha we si, Kọniliọs ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, nwoke bu onye ezi omume nke nātu kwa egwu Chineke, onye mba ndi-Ju dum nāb͕a-kwa-ra ya ezi àmà, ya ka mọ-ozi nke di nsọ duru ọdú site na Chineke, ikpọta gi n'ulo-ya, na inu okwu ufọdu si gi n'ọnu puta.

23. Ya mere ọ kpọbatara ha, le ha ọbìa.Ma n'echi-ya o bilie so ha pua, ufọdu nime umu-nna nime Kraist, bú ndi Jọpa, so-kwa-ra ya je.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọlu Ndi-Ozi 10