Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 6:8-17 Bible Nso (IGBOB)

8. M'we hu, ma le, inyinya nke aru-ya yiri ozu: onye nānọkwasi kwa ya, aha-ya bu Ọnwu; Hedis we so ya ga. Ewe nye ha ike ichi otù uzọ n'uzọ anọ nke uwa, iji mma-agha, na iji oké unwu, na iji ọnwu, nēb͕u, iwere kwa anu-ọhia nke uwa nēb͕u.

9. Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-ise, m'we hu n'okpuru ebe-ichu-àjà ahu nkpuru-obi nke ndi eb͕ururi n'ihi okwu Chineke, na n'ihi àmà ahu nke ha nwere:

10. ha we were oké olu tie nkpu, si, Rùe ole mb͕e, Onye-nwe-ayi, Onye di nsọ, buru kwa Onye-ezi-okwu, ka I nēkpeghi ikpé bọ̀ kwa ọ́bọ̀ ọbara-ayi n'isi ndi bi n'elu uwa?

11. Ewe nye ha n'otù n'otù uwe-nwuda di ọcha; ewe si ha, ka ha zuru ike nwa oge ọzọ, rue mb͕e ndi-orù-ibe-ha na umu-nna-ha gēzu kwa ezù, bú ndi agaje ib͕u dika eb͕u-kwa-ra ha onwe-ha.

12. M'we hu mb͕e Ọ saghere akàrà nke-isi, oké ala-ọma-jijiji we da; anyanwu we ghọ oji dika ákwà-nkpe nēji nji nke eji aji anu kpa, ewe me ọnwa ka ọ gbaze ka ọbara:

13. kpakpando nile nke elu-igwe we da rue ala, dika osisi fig nātupu nkpuru-ya nāchaghi acha, mb͕e oké ifufe nēfeghari ya.

14. Ewe kewapu elu-igwe dika akwukwọ-odide mb͕e anāpiakọta ya; ewe wepu ugwu nile na agwe-etiti nile ọ bula n'ọnọdu-ha.

15. Ndi-eze nke uwa, na ndi-amadi, na ndi-isi-ọchi-agha, na ndi-ọgaranya, na ndi di ike, na orù ọ bula, na onye ọ bula nwere onwe-ya, we zobe onwe-ha nime ọb͕à na nime oké nkume nke ugwu:

16. ha nāsi kwa ugwu na oké nkume ahu, Dakwasinu ayi, zopu ayi n'iru Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu, zopu kwa ayi n'iwe nke Nwa-aturu ahu:

17. n'ihi na oké ubọchi nke iwe-ha abiawo; ònye pu-kwa-ra iguzo?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nkpughe 6