isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 6 Bible Nso (IGBOB)

1. M'we hu mb͕e Nwa-aturu ahu saghere otù nime akàrà asa ahu, m'we nu otù nime ihe anọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, dika agāsi na o ji olu éb͕è-elu-igwe nēkwu, si, Bia.

2. M'we hu, ma le, inyinya ọcha, Onye nānọkwasi ya nwe-kwa-ra uta; ewe nye Ya okpu-eze: O we puta nēmeri, ya na ka O we meri.

3. Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-abua, m'we nu ihe nke-abua ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Bia.

4. Inyinya ọzọ we puta, bú inyinya nke nācha ọku ọku: ewe nye onye nānọkwasi ya ike inapu udo n'uwa, ya na ka ha we b͕urita onwe-ha: ewe nye ya oké mma-agha.

5. Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-atọ, m'we nu ihe nke-atọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Bia. M'we hu, ma le, inyinya oji; onye nānọkwasi ya nwe-kwa-ra ihe-ọtùtù n'aka-ya.

6. M'we nu dika agāsi na ọ bu otu n'etiti ihe anọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Otù ọtùtù ntà nke ọkà bu otù shilling, ọtùtù ntà atọ nke barley bu otù shilling; emejọ-kwa-la manu na manya-vine.

7. Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-anọ, m'we nu olu nke ihe nke-anọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Bia.

8. M'we hu, ma le, inyinya nke aru-ya yiri ozu: onye nānọkwasi kwa ya, aha-ya bu Ọnwu; Hedis we so ya ga. Ewe nye ha ike ichi otù uzọ n'uzọ anọ nke uwa, iji mma-agha, na iji oké unwu, na iji ọnwu, nēb͕u, iwere kwa anu-ọhia nke uwa nēb͕u.

9. Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-ise, m'we hu n'okpuru ebe-ichu-àjà ahu nkpuru-obi nke ndi eb͕ururi n'ihi okwu Chineke, na n'ihi àmà ahu nke ha nwere:

10. ha we were oké olu tie nkpu, si, Rùe ole mb͕e, Onye-nwe-ayi, Onye di nsọ, buru kwa Onye-ezi-okwu, ka I nēkpeghi ikpé bọ̀ kwa ọ́bọ̀ ọbara-ayi n'isi ndi bi n'elu uwa?

11. Ewe nye ha n'otù n'otù uwe-nwuda di ọcha; ewe si ha, ka ha zuru ike nwa oge ọzọ, rue mb͕e ndi-orù-ibe-ha na umu-nna-ha gēzu kwa ezù, bú ndi agaje ib͕u dika eb͕u-kwa-ra ha onwe-ha.

12. M'we hu mb͕e Ọ saghere akàrà nke-isi, oké ala-ọma-jijiji we da; anyanwu we ghọ oji dika ákwà-nkpe nēji nji nke eji aji anu kpa, ewe me ọnwa ka ọ gbaze ka ọbara:

13. kpakpando nile nke elu-igwe we da rue ala, dika osisi fig nātupu nkpuru-ya nāchaghi acha, mb͕e oké ifufe nēfeghari ya.

14. Ewe kewapu elu-igwe dika akwukwọ-odide mb͕e anāpiakọta ya; ewe wepu ugwu nile na agwe-etiti nile ọ bula n'ọnọdu-ha.

15. Ndi-eze nke uwa, na ndi-amadi, na ndi-isi-ọchi-agha, na ndi-ọgaranya, na ndi di ike, na orù ọ bula, na onye ọ bula nwere onwe-ya, we zobe onwe-ha nime ọb͕à na nime oké nkume nke ugwu:

16. ha nāsi kwa ugwu na oké nkume ahu, Dakwasinu ayi, zopu ayi n'iru Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu, zopu kwa ayi n'iwe nke Nwa-aturu ahu:

17. n'ihi na oké ubọchi nke iwe-ha abiawo; ònye pu-kwa-ra iguzo?