Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 22:7-18 Bible Nso (IGBOB)

7. Le kwa, anamabia ọsọsọ. Ngọzi nādiri onye nēdebe okwu nile nke amuma nke akwukwọ a.

8. Mu onwem Jọn bu kwa onye nānu nāhu kwa ihe ndia. Mb͕e m'nuru, hu kwa, m'we da n'ala ikpọ isi ala n'iru ukwu mọ-ozi ahu onye nēgosim ihe ndia.

9. O we sim, Lezi anya ka i ghara ime ya: abum orù-ibe-gi, buru kwa orù-ibe nke umu-nna-gi, bú ndi-amuma, ha na ndi nēdebe okwu nile nke akwukwọ a: kpọ isi ala nye Chineke.

10. O we sim, Akala okwu nile nke amuma nke akwukwọ a akàrà; n'ihi na oge ahu di nso.

11. Onye nēme ajọ omume, ya me ajọ omume ga n'iru: onye ru-kwa-ra inyi, ka eme ka o ru inyi ga n'iru: onye ezi omume, ya me ezi omume ga n'iru: onye di kwa nsọ, ka edo ya nsọ ga n'iru.

12. Le, anamabia ọsọsọ; ugwọ-ọlum di kwa n'akam, inyeghachi onye ọ bula dika ọlu-ya si di.

13. Mu onwem bu Alfa ahu na Omega ahu, onye mbu na onye ikpe-azu, nmalite na ọgwugwu.

14. Ngọzi nādiri ndi nāsa uwe-nwuda-ha, ka ha we nwe ike n'ebe osisi nke ndu ahu di, si kwa n'ọnu-uzọ-ama ahu ba nime obodo ahu.

15. N'azu obodo ka ha di, bú nkita nile, na ndi nile nāgwọ nsi, na ndi nile nākwa iko, na ndi-ob͕u-madu nile, na ndi nēkpere arusi, na onye ọ bula nke nāhu ugha n'anya nēme kwa ya.

16. Mu onwem, bú Jisus, zitere mọ-ozim iwere ihe ndia b͕ara unu àmà nye nzukọm nile. Mu onwem bu nkpọrọgwu Devid, buru kwa nwa ọ muru, kpakpando nēnwu enwu, nke bu kwa kpakpando ututu ahu.

17. Mọ Nsọ na nwanyi ahu anālu ọhu nāsi kwa, Bia. Onye nānu, ya si kwa, Bia. Onye akpiri nākpọ kwa nku, ya bia: onye nāchọ, ya nara miri nke ndu ahu n'efù.

18. Mu onwem nāb͕ara onye ọ bula àmà, bú onye nānu okwu nile nke amuma nke akwukwọ a, si, Ọ buru na onye ọ bula gātukwasiri ha okwu, Chineke gātukwasiri ya ihe-otiti nile nke edeworo n'akwukwọ a:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nkpughe 22