Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 22:5-11 Bible Nso (IGBOB)

5. Abali agaghi-adi kwa ọzọ; ìhè oriọna na ìhè anyanwu adighi kwa ha nkpà; n'ihi na Onye-nwe-ayi Chineke gēnye ha ìhè: ha ganābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.

6. O we sim, Okwu ndia kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa ezi-okwu: Onye-nwe-ayi, bú Chineke nke ndi-mọ nke ndi-amuma, zite-kwa-ra mọ-ozi-Ya igosi ndi-orù-Ya ihe nile nāghaghi iputa na mb͕e ntà.

7. Le kwa, anamabia ọsọsọ. Ngọzi nādiri onye nēdebe okwu nile nke amuma nke akwukwọ a.

8. Mu onwem Jọn bu kwa onye nānu nāhu kwa ihe ndia. Mb͕e m'nuru, hu kwa, m'we da n'ala ikpọ isi ala n'iru ukwu mọ-ozi ahu onye nēgosim ihe ndia.

9. O we sim, Lezi anya ka i ghara ime ya: abum orù-ibe-gi, buru kwa orù-ibe nke umu-nna-gi, bú ndi-amuma, ha na ndi nēdebe okwu nile nke akwukwọ a: kpọ isi ala nye Chineke.

10. O we sim, Akala okwu nile nke amuma nke akwukwọ a akàrà; n'ihi na oge ahu di nso.

11. Onye nēme ajọ omume, ya me ajọ omume ga n'iru: onye ru-kwa-ra inyi, ka eme ka o ru inyi ga n'iru: onye ezi omume, ya me ezi omume ga n'iru: onye di kwa nsọ, ka edo ya nsọ ga n'iru.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nkpughe 22