Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 21:20-27 Bible Nso (IGBOB)

20. nke-ise bu sardonyx; nke-isi bu sardius; nke-asa bu chrysolite; nke-asatọ bu beryl; nke-iteghete bu topaz; nke-iri bu chrysoprase; nke-iri-na-otù bu jacinth; nke-iri-na-abua bu amethyst.

21. Ọnu-uzọ-ama iri na abua ahu bu pearl iri na abua; eji otù pearl me ọnu-uzọ-ama ọ bula nime ọnu-uzọ-ama ahu nile: amá obodo ahu bu ọla-edo anuchara anucha, dika enyo nāhu uzọ.

22. Ọ dighi kwa ulo nsọ ọ bula m'huru nime ya: n'ihi na Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, Ya na Nwa-aturu ahu, bu ulo nsọ ya.

23. Anyanwu ma-ọbu ọnwa adighi kwa obodo ahu nkpà, ka ha mukwasi ya: n'ihi na ebube Chineke nyere ya ìhè, oriọna-ya bu kwa Nwa-aturu ahu.

24. Mba nile gēwere kwa ìhè-ya jegharia: ndi-eze nke uwa nēwebata kwa ebube-ha nime ya.

25. Agaghi-emechi kwa ọnu-uzọ-ama-ya n'ehihie ma-ọli (n'ihi na abali agaghi-adi n'ebe ahu):

26. ha gēwebata kwa ebube na nsọpuru nke mba nile nime ya:

27. ọ dighi kwa ihe ọ bula emeruru emeru, ma-ọbu onye nēme ihe-árú na ugha, gābà nime ya ma-ọli: kama ọ bu nání ndi edeworo aha-ha n'akwukwọ nke ndu Nwa-aturu ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nkpughe 21