24. Ma unu ka m'nāgwa, bú ndi fọduru na Taiataira, ka unu ra, bú ndi nēnweghi ozizí a, madu ndi nāmaghi ihe nile di omimi nke Setan, dika ha nēkwu; ebokwasighi m unu ibu arọ́ ọzọ.
25. Otú ọ di, ihe unu nwere, jidesienu ya ike rue mb͕e M'gābia.
26. Onye nēmeri emeri, na onye nēdebe ọlum nile rue ọgwugwu ihe nile, ya ka M'gēnye kwa ike ichi mba nile:
27. ọ gewere kwa nkpa-n'aka ígwè zùa ha dika aturu, dika anākujisi ite nke ọkpu-ite; dika Mu onwem natawokwara n'aka Nnam:
28. M'gēnye kwa ya kpakpando ututu.
29. Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.