Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 17:10-18 Bible Nso (IGBOB)

10. ndi-eze asa di kwa; ise nime ha adawo, otù nime ha nādi adi, onye fọduru akābiaghi; mb͕e ọ gābia ọ ghaghi kwa inọgide nwa oge.

11. Anu-ọhia ahu nke diri, nke nādighi kwa ub͕u a, ya onwe-ya bu kwa nke-asatọ, o si kwa n'asa ahu puta; ọ nāla kwa n'iyì.

12. Mpi iri ahu nke i hu-kwa-ra bu eze iri, madu ndi akānataghi ala-eze ọ bula; ma ha nānata ike dika ndi-eze, ha na anu-ọhia ahu, otù oge hour.

13. Ndia nwere otù ọlū, ha nēwere kwa ike-ha na ichi-isi-ha nye anu-ọhia ahu.

14. Ndia gēbu agha megide Nwa-aturu ahu, Nwa-aturu ahu gēmeri kwa ha, n'ihi na Ọ bu Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile, na Eze kachasi ndi-eze nile; ndi soro Ya gēmeri kwa, bú ndi akpọworo, ndi arọputawo-kwa-ra, ndi kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi.

15. O we sim, Miri nile i huru, ebe nwanyi ahu onye nākwa iko nānọdu, bu ndi di iche iche, na ìgwè madu, na mba di iche iche, na asusu di iche iche.

16. Mpi iri ahu i huru, ha na anu-ọhia ahu, ndia gākpọ nwanyi ahu nākwa iko asì, ha gēme kwa ya ka ọ buru onye tọb͕ọrọ n'efu buru kwa onye b͕a ọtọ, ha gēri kwa anu-aru-ya, rechapu kwa ya n'ọku.

17. N'ihi na Chineke tiyere n'obi-ha ime ìzù-Ya, na ib͕ata otù ìzù, na iwere ala-eze-ha nye anu-ọhia ahu, rue mb͕e agēmezu okwu nile nke Chineke.

18. Ma nwanyi ahu i huru bu obodo uku ahu, nke nwere ala-eze nāchi ndi-eze uwa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nkpughe 17