Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 16:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. M'we nu oké olu ka ọ nēsi n'ulo nsọ ahu dà, nāsi ndi-mọ-ozi asa ahu, Jenu, wusi ọkwa asa ahu nke ọnuma Chineke nime uwa.

2. Mọ-ozi mbu we je, wusi ọkwa-ya nime uwa; ajọ ọnyá jọb͕uru onwe-ya we puta n'aru madu nile ndi nwere akàrà anu-ọhia ahu, ndi nākpọ kwa isi ala nye ihe-oyiyi-ya.

3. Mọ-ozi nke-abua we wusi ọkwa-ya nime oké osimiri; o we ghọ ọbara dika nke madu nwuru anwu; nkpuru-obi nile ọ bula nke di ndu we nwua, bú ihe di n'oké osimiri.

4. Mọ-ozi nke-atọ we wusi ọkwa-ya nime osimiri nile na isi-iyi nile nke miri nile; miri ahu we ghọ ọbara.

5. M'we nu mọ-ozi miri nile ka ọ nāsi, Onye ezi omume ka I bu, Gi Onye nādi adi, Onye di-kwa-ri, Onye di ọcha n'obi, n'ihi na I kpere ikpé ndia:

6. n'ihi na ha wusiri ọbara ndi nsọ na ndi-amuma, ọbara ka I nyewo-kwa-ra ha ka ha ṅua: ha bu ndi kwesiri ekwesi.

7. M'we nu ebe-ichu-àjà ahu ka ọ nāsi, E, Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, ikpé-Gi nile bu ezi-okwu na ikpé ziri ezi.

8. Mọ-ozi nke-anọ we wusi ọkwa-ya n'elu anyanwu; ewe nye ya ike iji ọku chab͕u madu.

9. Ewe were oké okpom-ọku chab͕ue madu: ha we kwulu aha Chineke ahu Onye nwere ike ichi ihe-otiti ndia isi; ha echègharighi kwa inye Ya otuto.

10. Mọ-ozi nke-ise we wusi ọkwa-ya n'elu oche-eze nke anu-ọhia ahu; ewe me ka ala-eze-ya b͕a ọchichiri; ha we tabìe ire-ha site n'aru-ufu,

11. ha we kwulu Chineke nke elu-igwe site n'aru-ufu nile ha na ọnyá nile ha; ha echègharighi kwa isi n'ọlu nile ha puta.

12. Mọ-ozi nke-isi we wusi ọkwa-ya n'elu osimiri uku ahu, bú Yufretis; miri-ya we tasia, ka ewe dozie uzọ ndi-eze ahu ndi si n'ọwūwa-anyanwu bia.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nkpughe 16