isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nkpughe 16 Bible Nso (IGBOB)

1. M'we nu oké olu ka ọ nēsi n'ulo nsọ ahu dà, nāsi ndi-mọ-ozi asa ahu, Jenu, wusi ọkwa asa ahu nke ọnuma Chineke nime uwa.

2. Mọ-ozi mbu we je, wusi ọkwa-ya nime uwa; ajọ ọnyá jọb͕uru onwe-ya we puta n'aru madu nile ndi nwere akàrà anu-ọhia ahu, ndi nākpọ kwa isi ala nye ihe-oyiyi-ya.

3. Mọ-ozi nke-abua we wusi ọkwa-ya nime oké osimiri; o we ghọ ọbara dika nke madu nwuru anwu; nkpuru-obi nile ọ bula nke di ndu we nwua, bú ihe di n'oké osimiri.

4. Mọ-ozi nke-atọ we wusi ọkwa-ya nime osimiri nile na isi-iyi nile nke miri nile; miri ahu we ghọ ọbara.

5. M'we nu mọ-ozi miri nile ka ọ nāsi, Onye ezi omume ka I bu, Gi Onye nādi adi, Onye di-kwa-ri, Onye di ọcha n'obi, n'ihi na I kpere ikpé ndia:

6. n'ihi na ha wusiri ọbara ndi nsọ na ndi-amuma, ọbara ka I nyewo-kwa-ra ha ka ha ṅua: ha bu ndi kwesiri ekwesi.

7. M'we nu ebe-ichu-àjà ahu ka ọ nāsi, E, Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, ikpé-Gi nile bu ezi-okwu na ikpé ziri ezi.

8. Mọ-ozi nke-anọ we wusi ọkwa-ya n'elu anyanwu; ewe nye ya ike iji ọku chab͕u madu.

9. Ewe were oké okpom-ọku chab͕ue madu: ha we kwulu aha Chineke ahu Onye nwere ike ichi ihe-otiti ndia isi; ha echègharighi kwa inye Ya otuto.

10. Mọ-ozi nke-ise we wusi ọkwa-ya n'elu oche-eze nke anu-ọhia ahu; ewe me ka ala-eze-ya b͕a ọchichiri; ha we tabìe ire-ha site n'aru-ufu,

11. ha we kwulu Chineke nke elu-igwe site n'aru-ufu nile ha na ọnyá nile ha; ha echègharighi kwa isi n'ọlu nile ha puta.

12. Mọ-ozi nke-isi we wusi ọkwa-ya n'elu osimiri uku ahu, bú Yufretis; miri-ya we tasia, ka ewe dozie uzọ ndi-eze ahu ndi si n'ọwūwa-anyanwu bia.

13. M'we hu ndi-mọ atọ nādighi ọcha, dika awọ̀, ka ha nēsi n'ọnu dragon ahu, si kwa n'ọnu anu-ọhia ahu, si kwa n'ọnu onye-amuma ugha ahu, puta:

14. n'ihi na ha bu mọ nke ndi-mọ ọjọ, nēme ihe-iriba-ama di iche iche; ndi nāpukuru ndi-eze nke elu-uwa dum madu bi, ime ka ha zukọ ibu agha nke oké ubọchi ahu nke Chineke, Onye puru ime ihe nile.

15. (Le, anamabia dika onye-ori. Ngọzi nādiri onye nēche nche, nēdebe kwa uwe-ya, ka ọ ghara ijeghari n'ọtọ, ha we hu ihere-ya.)

16. Ha we me ka ha zukọ n'ebe ahu nke anākpọ n'asusu Hibru Amagedọn.

17. Mọ-ozi nke-asa we wusi ọkwa-ya n'elu mbara-elu-igwe; oké olu we si n'ulo nsọ ahu daputa, si n'ebe oche-eze ahu di, nāsi, Emewo ya:

18. àmùmà, na olu, na éb͕è-elu-igwe, we so; oké ala-ọma-jijiji so-kwa-ra, nke ala-ọma-jijiji di otú a adaghi mb͕e ọ bula site na mb͕e madu putara n'elu uwa, ala-ọma-jijiji di uku otú a, oké ala-ọma-jijiji di otú a.

19. Ewe kewa obodo uku ahu uzọ atọ, obodo nile nke mba nile we da: ewe cheta Babilon uku ahu n'iru Chineke, inye ya iko nke manya nke ọnuma nke iwe-Ya.

20. Agwe-etiti nile ọ bula we b͕alaga, ahughi kwa ugwu nile ọzọ.

21. Oké ákú-miri-ígwé, nke ra ka talent n'arọ́ n'otù, nēsi kwa n'elu-igwe ridata n'aru madu: madu we kwulu Chineke site n'ihe-otiti nke ákú-miri-ígwé ahu; n'ihi na ihe-otiti-ya di uku ri nne.