Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Rom 9:27-33 Bible Nso (IGBOB)

27. Ma Aisaia nēti nkpu bayere Israel, si, Ọ buru na ọnu-ọgugu umu Israel di ka ájá nke oké osimiri, ọ bu nke fọduru ka agāzọputa:

28. n'ihí na Onye-nwe-ayi gēme ihe O kwuru n'elu uwa, nēmezu ya nēme kwa ya ka o bìe.

29. Ọzọ, dika Aisaia buru uzọ kwue,Ọ buru na Onye-nwe usu nile nke ndi-agha arapughi ayi otù nkpuru,Ayi gādiwori ka Sọdọm, agēmewori ayi ka ayi yie Gọmọra.

30. Gini ka ayi gēkwu kwa? Na ndi mba ọzọ, ọ bu ezie na ha ab͕asoghi ezi omume, ma ha ruru ezi omume, ma ọ bu ezi omume ahu nke si n'okwukwe puta:

31. ma Israel, ọ bu ezie na ha nāb͕aso iwu ezi omume, ma ha ekwudoghi iwu ahu.

32. N'ìhi gini? N'ihi na ha esiteghi n'okwukwe chọ ya, kama dika agāsi na ha sitere n'ọlu chọ ya. Ha suru ngọngọ na nkume nke isu-ngọngọ-ha;

33. dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,Le, anamatọb͕ọ nime Zaion nkume nke isu-ngọngọ, na oké nkume nke ima-n'ọnyà:Onye kwe-kwa-ra na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya n'iru.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Rom 9