Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Rom 6:3-16 Bible Nso (IGBOB)

3. Ma-ọbu ùnu amaghi na ka ayi-ra, bú ndi emere baptism iba nime Kraist Jisus, emere ayi baptism ibà n'ọnwu-Ya?

4. Ya mere esitere na baptism-ayi likọ ayi na Ya ibà n'ọnwu ahu: ka, dika esitere n'ebube nke Nna-Ya me ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie, ka ayi onwe-ayi we jeghari kwa na ndu ọhu otú a.

5. N'ihi na asi na ejiri oyiyi ọnwu-Ya me ka ayi na Ya tokọ buru otù ihe, agēji kwa oyiyi nke nbilite-n'ọnwu-Ya me ka ayi na Ya tokọ buru otù ihe;

6. ebe ayi mara nka, na akpọgidekọrọ Ya na madu ochie ayi n'obe, ka ewe me ka aru-ayi nke nmehie nwezu ghara idi irè, ka ayi we ghara idi nābu orù nke nmehie ọzọ;

7. n'ihi na onye nwuru anwu, aguwo ya o'nye ezi omume pua na nmehie-ya.

8. Ma ọ buru na ayi na Kraist nwukọrọ, ayi kwere na ayi na Ya gādikọ kwa ndu ọzọ;

9. n'ihi na ayi matara na ebe emere ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie Ọ gaghi-anwu ọzọ; ọnwu abughi kwa onye nēnwe Ya ọzọ.

10. N'ihi na ọnwu Ọ nwuru, Ọ nwuru nání otù ọnwu n'ebe nmehie di: ma ndu Ọ nādi, Ọ nādi n'ebe Chineke nọ.

11. Otú a unu onwe-unu, nāgu-kwa-nu na unu onwe-unu bu ndi nwuru anwu n'ebe nmehie di, ma na unu nādi ndu nime Kraist Jisus n'ebe Chineke nọ.

12. Ya mere, ka nmehie ghara idi nābu eze n'aru-unu nke puru inwu anwu, ime unu ka unu ṅa agu-ya nile nti:

13. unu adi-kwa-la nēche ihe di unu n'aru n'iru nmehie ka ha buru ihe-agha ajọ omume; kama chenu onwe-unu n'iru Chineke, dika ndi sitere na ndi nwuru anwu di ndu, che-kwa-nu ihe di unu n'aru n'iru Chineke ka ha buru ihe-agha ezi omume.

14. N'ihi na nmehie agaghi-abu onye-nwe-unu: n'ihi na unu anọghi n'okpuru iwu, kama n'okpuru amara.

15. Gini kwa? ọ̀ bu na ayi gēmehie, n'ihi na ayi anọghi n'okpuru iwu, kama n'okpuru amara? Chineke ekwela.

16. Ùnu amataghi na onye unu nēche onwe-unu n'iru ya ka unu buru ndi-orù iṅa ya nti, unu bu ndi-orù nke onye ahu unu nāṅa nti ya; ma-ọbu nke nmehie nēweta ọnwu, ma-ọ̀bu nke iṅa-nti nēweta ezi omume?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Rom 6