Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Rom 6:10-17 Bible Nso (IGBOB)

10. N'ihi na ọnwu Ọ nwuru, Ọ nwuru nání otù ọnwu n'ebe nmehie di: ma ndu Ọ nādi, Ọ nādi n'ebe Chineke nọ.

11. Otú a unu onwe-unu, nāgu-kwa-nu na unu onwe-unu bu ndi nwuru anwu n'ebe nmehie di, ma na unu nādi ndu nime Kraist Jisus n'ebe Chineke nọ.

12. Ya mere, ka nmehie ghara idi nābu eze n'aru-unu nke puru inwu anwu, ime unu ka unu ṅa agu-ya nile nti:

13. unu adi-kwa-la nēche ihe di unu n'aru n'iru nmehie ka ha buru ihe-agha ajọ omume; kama chenu onwe-unu n'iru Chineke, dika ndi sitere na ndi nwuru anwu di ndu, che-kwa-nu ihe di unu n'aru n'iru Chineke ka ha buru ihe-agha ezi omume.

14. N'ihi na nmehie agaghi-abu onye-nwe-unu: n'ihi na unu anọghi n'okpuru iwu, kama n'okpuru amara.

15. Gini kwa? ọ̀ bu na ayi gēmehie, n'ihi na ayi anọghi n'okpuru iwu, kama n'okpuru amara? Chineke ekwela.

16. Ùnu amataghi na onye unu nēche onwe-unu n'iru ya ka unu buru ndi-orù iṅa ya nti, unu bu ndi-orù nke onye ahu unu nāṅa nti ya; ma-ọbu nke nmehie nēweta ọnwu, ma-ọ̀bu nke iṅa-nti nēweta ezi omume?

17. Ma ekele diri Chineke, na unu buri ndi-orù nke nmehie, ma unu sitere n'obi-unu ṅa nti ihe-atù nke ozizi ahu nke arara unu nye n'aka-ya;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Rom 6