Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Rom 5:1-14 Bible Nso (IGBOB)

1. Ya mere ebe aguru ayi na ndi ezi omume site n'okwukwe, ayi na Chineke di n'udo site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist;

2. Onye ayi sitewo-kwa-ra n'aka-Ya nwe nkpọbata-ayi n'okwukwe-ayi nime amara nka ayi nēguzo nime ya; ayi nānya kwa isi, nādabere n'olile-anya nke otuto Chineke.

3. Ma ọ bughi nání nka, kama ayi nānya kwa isi nime nkpab͕u-ayi nile: ebe ayi matara na nkpab͕u nāluta ntachi-obi;

4. ntachi-obi ahu nāluta kwa ọnwunwa; ọnwunwa ahu nāluta kwa olile-anya:

5. Olile-anya ahu emeghi kwa ka ihere me ayi; n'ihi na awusaworo ihu-n'anya nke Chineke n'obi-ayi site n'aka Mọ Nsọ Nke enyere ayi.

6. N'ihi na mb͕e ayi nọ nādighi ike, mb͕e oge-Ya ruru Kraist nwuru n'ihi ndi nādighi-asọpuru Chineke.

7. N'ihi na ọ di ike na otù onye gānwu n'ihi onye ezi omume: n'ihi na ma eleghi anya otù onye gēnwe anya-ike ọbuná inwu n'ihi ezi madu.

8. Ma Chineke nēme ka ihu-n'anya nke aka Ya n'ebe ayi nọ puta ìhè, n'ihi na, mb͕e ayi nọ nābu ndi-nmehie, Kraist nwuru n'ihi ayi.

9. Ya mere nke kariri ri nne, ebe agusiri ayi na ndi ezi omume ub͕u a nime ọbara-Ya, agāzọputa ayi n'iwe Chineke site n'aka-Ya.

10. N'ihi na asi na, mb͕e ayi bu ndi-iro, esitere n'ọnwu Ọkpara-Ya me ka ayi na Chineke di n'otù: nke kariri ri nne bu, ebe emesiri ka ayi na Chineke di n'otù, na agāzọputa ayi nime ndu-Ya;

11. ma ọ bughi nání nka, kama ayi nānya kwa isi na Chineke site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye ayi siworo n'aka-Ya nata ime-ka-adi-n'otù a ub͕u a.

12. N'ihi nka, dika nmehie si n'aka otú madu ba n'uwa, dika ọnwu si n'aka nmehie ba kwa; ọnwu we si otú a gabiga rue madu nile, n'ihi na madu nile mehiere:

13. n'ihi na rue mb͕e iwu biara nmehie di n'uwa: ma adighi-agu nmehie mb͕e iwu nādighi.

14. Otú ọ di, ọnwu si n'oge Adam buru eze rue oge Moses, ọbuná ichiri ndi nēmehieghi n'oyiyi nke njehie Adam, onye bu ihe-atù nke Onye ahu gaje ibia.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Rom 5