Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Rom 4:4-10 Bible Nso (IGBOB)

4. Ma onye nālu ọlu, agughi ugwọ-ọlu-ya nye ya dika amara, kama dika ugwọ.

5. Ma onye nālughi ọlu, kama ọ kwere n'Onye ahu Nke nāgu onye nāsọpughi Chineke n'onye ezi omume, anāgu okwukwe-ya nye ya dika ezi omume.

6. Ọbuná dika Devid nāsi kwa na madu ahu bu onye ngọzi diri, bú onye Chineke nāgu ezi omume nye ya mb͕e ọ kālughi ọlu,

7. si,Ngọzi nādiri ndi ab͕aghara nmebì-iwu nile ha,Ndi ekpuchi-kwa-ra nmehie nile ha.

8. Ngọzi nādiri nwoke ahu onye Onye-nwe-ayi nāgaghi-agu nmehie nye ya.

9. Ọ̀ bu kwa ndi obibì-úgwù ka anākpọ ndi ngọzi a diri, ma-ọbu kwa ndi ebìghi-úgwù? n'ihi na ayi nāsi, Aguru okwukwe Abraham nye ya dika ezi omume.

10. Èsi kwa aṅa gu ya? àguru ya nye ya mb͕e ọ nọ n'obibì-úgwù, ma-ọbu mb͕e ọ nọ n'ebìghi-úgwù? Ọ bughi n'obibì-úgwù, kama ọ bu n'ebìghi-úgwù:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Rom 4