Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Rom 2:8-16 Bible Nso (IGBOB)

8. ma ndi di n'akuku nke ikpa-iche-iche, ndi nēkweyeghi kwa ezi-okwu, kama ha nēkweye ajọ omume, iwe na ọnuma,

9. nkpab͕u na oké nkpà, gādiri ha, n'elu nkpuru-obi ọ bula nke madu onye nāluputa ihe ọjọ, nke onye-Ju na mbu, na nke onye-Grik kwa;

10. ma otuto na nsọpuru na udo gādiri onye ọ bula nke nālu ezi ọlu, onye-Ju na mbu, na onye-Grik kwa:

11. n'ihi na ile-madu-anya-n'iru adighi n'ebe Chineke nọ.

12. N'ihi na ka ha ra, bú ndi mehiere nēnweghi iwu, ha gāla kwa n'iyì nēnweghi iwu: ka ha ra kwa, bú ndi mehiere n'okpuru iwu, agēsite n'iwu kpe ha ikpé;

13. n'ihi na ọ bughi ndi nānu iwu bu ndi ezi omume n'ebe Chineke nọ, kama ọ bu ndi nēdebe iwu ka agāgu na ndi ezi omume:

14. n'ihi na mb͕e ọ bula ndi mba ọzọ ndi nēnweghi iwu nēme ihe nile di n'iwu site ka esi mu ha, ndi ahu, ọ bu ezie na ha enweghi iwu, ma ha onwe-ha bu iwu enyere onwe-ha;

15. n'ihi na ha nēgosi ọlu iwu na edewo ya n'obi-ha, akọ-na-uche-ha nēso kwa ya nāb͕a àmà, ihe ha nātule n'obi-ha n'etiti onwe-ha nēbo kwa ha ebubo ma-ọbu ma eleghi anya nāgọpu ha;

16. n'ubọchi ahu mb͕e Chineke gēkpe ihe-nzuzo nile nke madu nile, dika ozi ọma m si di, site n'aka Jisus Kraist.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Rom 2