Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Rom 2:17-26 Bible Nso (IGBOB)

17. Ma ọ buru na akpọrọ gi onwe-gi aha onye-Ju, ọ buru kwa na i nēzu ike n'elu iwu, nānya kwa isi na Chineke,

18. nāma kwa ihe Ọ nāchọ, nānwa kwa ihe ha na ibe-ha di iche, ebe anēwere okwu-ọnu zí gi ihe site n'iwu-gi,

19. ọ buru kwa na eme ka i kweye na gi onwe-gi bu onye-ndú nke ndi-ìsì, ìhè nke ndi nọ n'ọchichiri,

20. onye nāzùputa ndi nēnweghi uche, onye-ozizí nke umu ọhu, ebe i nēnwe udi nke ihe-ọmuma na nke ezi-okwu n'iwu ahu;

21. ya mere gi onye nēzí madu-ibe-gi ihe, ì dighi-ezí onwe-gi? gi onye nēkwusa ka madu ghara izu ori, ì nēzu ori?

22. gi onye nāsi ka madu ghara ikwa iko, ì nākwa iko? gi onye nākpọ arusi ihe-árú, ì nēzu ihe ulo chi ori?

23. gi onye nānya isi n'iwu, ì nēme Chineke ihe-ihere site na njehie-gi n'iwu ahu?

24. N'ihi na anēkwulu aha Chineke n'etiti ndi mba ọzọ n'ihi unu, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ.

25. N'ihi na obibì-úgwù nāba urù ezie, ma ọ buru na i nēdebe iwu: ma ọ buru na i bu onye-njehie n'iwu, obibì-úgwù-gi aghọwo ebìghi-úgwù.

26. Ya mere ọ buru na onye ebìghi-úgwù nēdebe ihe nile iwu-gi guru n'ihe ziri ezi, àgaghi-agu ebìghi-úgwù-ya n'obibì-úgwù?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Rom 2