Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Rom 2:13-27 Bible Nso (IGBOB)

13. n'ihi na ọ bughi ndi nānu iwu bu ndi ezi omume n'ebe Chineke nọ, kama ọ bu ndi nēdebe iwu ka agāgu na ndi ezi omume:

14. n'ihi na mb͕e ọ bula ndi mba ọzọ ndi nēnweghi iwu nēme ihe nile di n'iwu site ka esi mu ha, ndi ahu, ọ bu ezie na ha enweghi iwu, ma ha onwe-ha bu iwu enyere onwe-ha;

15. n'ihi na ha nēgosi ọlu iwu na edewo ya n'obi-ha, akọ-na-uche-ha nēso kwa ya nāb͕a àmà, ihe ha nātule n'obi-ha n'etiti onwe-ha nēbo kwa ha ebubo ma-ọbu ma eleghi anya nāgọpu ha;

16. n'ubọchi ahu mb͕e Chineke gēkpe ihe-nzuzo nile nke madu nile, dika ozi ọma m si di, site n'aka Jisus Kraist.

17. Ma ọ buru na akpọrọ gi onwe-gi aha onye-Ju, ọ buru kwa na i nēzu ike n'elu iwu, nānya kwa isi na Chineke,

18. nāma kwa ihe Ọ nāchọ, nānwa kwa ihe ha na ibe-ha di iche, ebe anēwere okwu-ọnu zí gi ihe site n'iwu-gi,

19. ọ buru kwa na eme ka i kweye na gi onwe-gi bu onye-ndú nke ndi-ìsì, ìhè nke ndi nọ n'ọchichiri,

20. onye nāzùputa ndi nēnweghi uche, onye-ozizí nke umu ọhu, ebe i nēnwe udi nke ihe-ọmuma na nke ezi-okwu n'iwu ahu;

21. ya mere gi onye nēzí madu-ibe-gi ihe, ì dighi-ezí onwe-gi? gi onye nēkwusa ka madu ghara izu ori, ì nēzu ori?

22. gi onye nāsi ka madu ghara ikwa iko, ì nākwa iko? gi onye nākpọ arusi ihe-árú, ì nēzu ihe ulo chi ori?

23. gi onye nānya isi n'iwu, ì nēme Chineke ihe-ihere site na njehie-gi n'iwu ahu?

24. N'ihi na anēkwulu aha Chineke n'etiti ndi mba ọzọ n'ihi unu, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ.

25. N'ihi na obibì-úgwù nāba urù ezie, ma ọ buru na i nēdebe iwu: ma ọ buru na i bu onye-njehie n'iwu, obibì-úgwù-gi aghọwo ebìghi-úgwù.

26. Ya mere ọ buru na onye ebìghi-úgwù nēdebe ihe nile iwu-gi guru n'ihe ziri ezi, àgaghi-agu ebìghi-úgwù-ya n'obibì-úgwù?

27. onye ebìghi-úgwù ka esi mu ya, ma ọ buru na ọ debezu iwu, ọ̀ gaghi-ekpe kwa gi ikpé, onye sitere n'ihe edeworo n'akwukwọ na obibì-úgwù bu onye-njehie n'iwu?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Rom 2