Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Rom 10:15-17 Bible Nso (IGBOB)

15. ma hà gēsi aṅa kwusa, ma ọ buru na ezigaghi ha? dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Le, ka ha si ma nma nke-uku, bú ukwu ndi nēzisa ozi ọma nke ezi ihe!

16. Ma ọ bughi ha nile ṅara ozi ọma ahu nti. N'ihi na Aisaia nāsi, Onye-nwe-ayi, ònye kwere ihe ayi nuworo?

17. Ya mere, okwukwe si n'ọnunu puta, ma ọnunu ahu sitere n'okwu Kraist.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Rom 10