Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Kọlọsi 1:6-16 Bible Nso (IGBOB)

6. nke biaruru unu; dika ọ nāmiju kwa nkpuru n'uwa nile, nāba kwa uba, dika ọ nēme kwa n'etiti unu, site n'ubọchi unu nuru mazu kwa amara Chineke n'ezi-okwu;

7. dika unu mutara n'ọnu Epafras orù-ibe-ayi onye ayi huru n'anya, onye bu onye kwesiri ntukwasi-obi n'ijere Kraist ozi n'ọnọdu ayi,

8. onye gosi-kwa-ra ayi ihun-anya-unu nime Mọ Nsọ.

9. N'ihi nka ayi onwe-ayi kwa, site n'ubọchi ayi nuru ya, ayi ewepughi aka n'ikpe ekpere na iriọ aririọ n'ihi unu, ka ewe me ka unu juputa na nmazu nke ihe Ọ nāchọ nime amam-ihe na nghọta nile nke Mọ Nsọ,

10. ka unu jegharia n'uzọ kwesiri Onye-nwe-ayi ime otú ọ gātọ Ya utọ n'uzọ nile, nāmi nkpuru n'ezi ọlu nile ọ bula, nāba kwa uba nime nmazu nke Chineke;

11. ebe anēme ka unu di ike nime ike nile, dika ike nke ebube-Ya si di, rue ntachi-obi na ogologo-ntachi-obi nile, ya na ọṅù;

12. nēkele Nna-ayi, Onye mere ka ayi rue iketa òkè-ayi n'ihe-nketa ndi nsọ n'ìhè;

13. Onye dọputara ayi n'ike nke ọchichiri, we webiga ayi n'ala-eze nke Ọkpara nke ihu-n'anya-Ya;

14. Onye ayi nwere nb͕aputa-ayi nime Ya, bú nb͕aghara nmehie nile ayi:

15. Onye bu onyinyo nke Chineke ahu Nke anāpughi ihu anya, buru kwa onye eburu uzọ mu n'ihe nile ekère èkè;

16. n'ihi na nime Ya ka ekère ihe nile, nke di nime elu-igwe na nke di n'elu uwa, ihe apuru ihu anya na ihe anāpughi ihu anya, ma ọ bu oche-eze, ma-ọbu ibu-ndi-nwe-madu, ma-ọbu ibu-ndi-isi, ma-ọbu ichi-isi; esitewo n'aka-Ya kè ihe nile, ekèwo-kwa-ra Ya ihe nile;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Kọlọsi 1