Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Hibru 8:7-13 Bible Nso (IGBOB)

7. N'ihi na asi na ọb͕ub͕a-ndu mbu ahu adighi ita uta, agaghi-achọwori ebe nye ọb͕ub͕a-ndu nke-abua.

8. N'ihi na mb͕e Ọ nāta ha uta, Ọ si,Le, ubọchi nābia, ka Onye-nwe-ayi kwuru,Mb͕e Mu na ulo Israel na ulo Juda gāb͕a ọb͕ub͕a-ndu ọhu;

9. Ọ bughi dika ọb͕ub͕a-ndu ahu si di nke Mu na ndi bu nna-ha b͕araN'ubọchi M'jidere ha n'aka isi n'ala Ijipt duputa ha;N'ihi na ha onwe-ha anọgideghi n'ọb͕ub͕a-ndum,Mu onwem lefukwara ha anya, ka Onye-nwe-ayi kwuru,

10. N'ihi na nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ulo Israel gāb͕aMb͕e ubọchi nile ahu gasiri, ka Onye-nwe-ayi kwuru;M'gētiye iwum n'uche-ha,Ọ bu kwa n'obi-ha ka M'gēdekwasi ha dika n'akwukwọ:M'gābu-kwa-ra ha Chineke,Ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi:

11. Ha agaghi-izírita onwe-ha ma-ọli, onye ọ bula ọ nēzí onye obodo-ya,Onye ọ bula ọ nēzí kwa nwa-nne-ya, si, Mara Onye-nwe-ayi:N'ihi na ha nile gāmatam,Site n'onye dikarisiri ntà rue onye dikarisiri uku nime ha.

12. N'ihi na M'gēmere ajọ omume nile ha ebere,M'gaghi-echeta kwa nmehie nile ha ọzọ ma-ọli.

13. Mb͕e Ọ nāsi, Ọb͕ub͕a-ndu ọhu, O mewo nke-mbu ka ọ buru ihe ochie. Ma ihe nēme ochie, nke nāka kwa nká, ga-apu-n'anya nso.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Hibru 8