Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Hibru 13:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Ka ihu-n'anya-unu n'ebe umu-nna-unu nọ nādigide.

2. Unu echezọla ile ndi-ọbìa nke-ọma: n'ihi na ufọdu esitewo na nka le ndi-mọ-ozi ọbìa nāmaghi ama.

3. Nēchetanu ndi nọ n'ab͕u, dika ndi ekekọworo unu na ha n'ab͕u; nēchetanu ndi anēmejọ, dika ndi unu onwe-unu nọ kwa n'aru.

4. Ka ilu-di-na-nwunye buru ihe anāsọpuru n'etiti unu nile, ka ihe-ndina-unu buru kwa ihe adighi-emeru emeru: n'ihi na Chineke gēkpe ndi nākwa iko ikpé, ha na ndi nākwa iko, bú ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di.

5. Ka ọchichọ-obi-unu ghara idi n'ihu-n'anya ego; ka afọ ju unu n'ihe unu nwere ub͕u a: n'ihi na Ya onwe-ya ekwuwo, si, M'gaghi-ara gi aka ma-ọli, M'gaghi-arapu kwa gi ma-ọli.

6. Ya mere ayi were obi-ike si,Onye-nwe-ayi bu onye nēyerem aka;Gini ka madu gēmem?

7. Nēchetanu ndi-isi-unu, bú madu ndi gwara unu okwu Chineke; nēkiri-kwa-nu ọpupu nke ibi-obi-ha, nēṅomi-kwa-nu okwukwe-ha.

8. Jisus Kraist di otù aka ahu nnyahu na ta, ma rukwa mb͕e nile ebighi-ebi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Hibru 13