Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Hibru 12:13-20 Bible Nso (IGBOB)

13. kwa-kwa-ranu ukwu-unu uzọ nke nēguzozi ọtọ, ka ewe ghara ime ka ukwu nke di ngwurọ kwopu, kama ka ewe me ka ọ di ike.

14. Nāb͕asonu udo n'ebe madu nile nọ, ya na ido-nsọ ahu, nke onye ọ bula agaghi-ahu Onye-nwe-ayi anya ma o nweghi ya:

15. nēle-kwa-nu anya nke-ọma, ma ọ di onye ọ bula nke nērughi amara Chineke; ka nkpọrọgwụ ilu obula we ghara ipuputa we sob͕ue unu; ewe were nkpọrọgwụ ahu meru ọra madu;

16. ma ọ di onye ọ bula nke nākwa iko, ma-ọbu nke emeruru emeru, dika Isọ, onye rere di-ọkpara ya onwe-ya bu n'ọnọdu otù oriri.

17. N'ihi na unu matara na ọbuná mb͕e ọ chọrọ iketa ngọzi ahu mb͕e emesiri, ajuru ya (n'ihi na ọ hughi ọnọdu nke nchèghari), ọ bu ezie na o were anya-miri chọsie ya ike.

18. N'ihi na unu abiarughi ọku nke apuru idatu ya aka na nke afunwuworo, na itiri, na ọchichiri, na oké ifufe,

19. na udà opì, na olu okwu; nke ndi nuru ya riọrọ ka aghara itukwasiri ha okwu ọ bula ọzọ:

20. n'ihi na ha anānagideghi ihe enyere n'iwu, bú, Asi na ọbuná anu-ulo emetu ugwu ahu, agēwere nkume tub͕ue ya;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Hibru 12