Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Hibru 11:5-9 Bible Nso (IGBOB)

5. Okwukwe ka eji būbiga Inok ka ọ ghara ihu ọnwu; ahughi kwa ya, n'ihi na Chineke bubigara ya-ri: n'ihi na mb͕e akēbubigaghi ya ab͕aworo ya àmà na ihe ọ nēmeri nātọ Chineke ezi utọ:

6. ma asi na okwukwe adighi ọ bu ihe anāpughi ime, bú ime ihe gātọ Chineke ezi utọ: n'ihi na onye nābiakute Chineke aghaghi ikwe na Ọ di, na Ọ nēgosi kwa Onwe-ya Onye nēnyeghachi ndi nāchọ Ya ugwọ-ọlu.

7. Noa, mb͕e Chineke dusiri ya ọdu bayere ihe akāhughi anya rue oge ahu, ebe ọ turu egwu Chineke, ọ bu okwukwe ka o ji dozie ub͕ọ izọputa èzí-na-ulo-Ya; o site-kwa-ra na nka ma uwa ikpé, we ghọ onye-nketa nke ezi omume ahu nke di n'uzọ okwukwe.

8. Mb͕e akpọrọ Abraham, okwukwe ka o ji ṅa nti ipu je ebe nke ọ gaje inara ka ọ buru ihe-nketa; o we pua, nāmaghi ebe ọ nēje.

9. Okwukwe ka o ji biri dika ọbìa n'ala nke ekwere ya-ri na nkwa, dika ala nābughi nke aka ya, ebe o biri n'ulo-ikwū, ya na Aisak na Jekob, ndi soro ya nēketakọ otù nkwa ahu:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Hibru 11