Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Hibru 11:13-17 Bible Nso (IGBOB)

13. Ndia nile nwuru n'uzọ okwukwe, ebe ha anataghi nkwa ahu, kama ha huru ha-ri, si kwa n'ebe di anya kele ha, we kwuputa na ha bu ndi-ọbìa na ndi nọ dika ọbìa n'elu uwa.

14. N'ihi na ndi nēkwu ihe di otú a nēgosi na ha nāchọ ala nke gābu nke aka ha.

15. Ọ buru kwa na ọ bu ezie na ha nēcheta ala ahu nke ha si nime ya puta, ha gēnwewori oghere ilaghachi.

16. Ma otú ọ di ub͕u a ha nāb͕aso ala ka nma, nke ahu bu, ala di n'elu-igwe: n'ihi nka ihere ha adighi-eme Chineke, ka akpọ Ya Chineke-ha: n'ihi na O doziworo ha otù obodo.

17. Mb͕e anānwa Abraham, ọ bu okwukwe ka o ji che Aisak n'iru Chineke dika àjà: e, onye ahu nke narari nkwa ahu nke-ọma nēche nwa-nwoke ọ muru nání ya n'iru Chineke dika àjà:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Hibru 11