Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Hibru 10:1-15 Bible Nso (IGBOB)

1. N'ihi na iwu ahu, ebe o nwere nání onyinyo nke ezi ihe ahu nile gaje ibia, ọ bughi ezi oyiyi onwe-ya nke ihe ndia, ha apughi ime ka ndi nābiaru ha nso zue okè mb͕e ọ bula, site n'otù àjà ndia nke ha nēche n'iru Chineke kwa-arọ mb͕e nile.

2. N'ihi na ma ọ dighi otú a, àgaghi-echebìwori ha n'iru Chineke, n'ihi na ndi nēkpe ekpere, ebe emeworo ka ha di ọcha otù mb͕e, ha agaghi-enwe akọ-na-uche ọ bula nke nmehie di iche iche ọzọ?

3. Ma nime àjà ndia ncheta nke nmehie di kwa-arọ.

4. N'ihi na ọbara nke oke-ehi na nke ewu apughi iwepu nmehie.

5. N'ihi nka mb͕e Ọ nābia n'uwa, Ọ si,Àjà na ihe echere n'iru Gi, I chọghi ha,Ma aru ka I kwadebere nyem;

6. Àjà-nsuresi-ọku na àjà achuru bayere nmehie, ha abughi ihe di Gi ezi nma:

7. Mb͕e ahu ka M'siri, Le, abiawom(N'akwukwọ-npiakọta ka edeworo ihe bayerem)Ime ihe I nācho, Chineke.

8. Mb͕e O buru uzọ kwu, si, Àjà na ihe echere n'iru Gi na àjà-nsuresi-ọku na àjà achuru bayere nmehie, I chọghi ha, ha abughi kwa ihe di Gi ezi nma (bú ihe anēche n'iru Chineke dika iwu si di),

9. mb͕e ahu ka Ọ siworo, Le, abiawom ime ihe I nāchọ. Ọ nēwepu nke-mbu, ka O we me ka nke-abua guzo.

10. Ọ bu kwa n'ọchichọ a ka edoworo ayi nsọ site n'iche aru Jisus Kraist n'iru Chineke dika àjà nání otù mb͕e.

11. Onye-nchu-àjà ọ bula nēguzo kwa kwa-ubọchi nēfè òfùfè nēche kwa otù àjà ndia n'iru Chineke ọtutu mb͕e, bú àjà nke nāpughi ihichapu nmehie mb͕e ọ bula:

12. ma Onye ahu, mb͕e O chereri otù àjà n'iru Chineke n'ihi nmehie, O we nọdu n'aka-nri Chineke mb͕e nile;

13. nēle anya n'oge fọduru rue mb͕e agēdo ndi-iro-Ya dika ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Ya abua.

14. N'ihi na O sitewo n'iche Onwe-ya n'iru Chineke dika àjà otù mb͕e me ka ndi anēdo nsọ zue okè mb͕e nile.

15. Mọ Nsọ nāb͕a-kwa-ra ayi àmà: n'ihi na mb͕e O kwuru, si,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Hibru 10