Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Galetia 4:18-31 Bible Nso (IGBOB)

18. Ma ọ di nma ka ewere obi nānu ọku chọ unu n'ihe ọma mb͕e nile, ọ bughi kwa nání mb͕e m'nọ n'etiti unu.

19. Umu-ntakirim, unu ndi ime unu nēmem ọzọ rue mb͕e agēme ka udi Kraist di nime unu,

20. ọ gādim nọ̄ nma ma asi na apurum inọ n'etiti unu ub͕u a, na ib͕anwe olu m; n'ihi na enwerem obi abua n'ebe unu nọ.

21. Gwanum, unu ndi nāchọ inọ n'okpuru iwu, ùnu adighi-anu iwu ahu?

22. N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, na Abraham nwere umu-ndikom abua, otù site n'orù-nwanyi ahu, otù site kwa na nwanyi ahu nke nwere onwe-ya.

23. Ma ọ bu n'uzọ anu-aru ka amuworo nwa nke sitere n'orù-nwanyi ahu; ma esitewo na nkwa mu nwa nke sitere na nwanyi ahu nwere onwe-ya.

24. Ma ewere ihe ndia ma atù: n'ihi na ndinyom abua ndia bu ọb͕ub͕a-ndu abua; otù si n'ugwu Sainai puta, nāmu umu nye n'orù, nwanyi ahu bu Hega.

25. N'ihi na Sainai nka bu ugwu di n'Arebia, ya na Jerusalem nke di ub͕u a kwu kwa: n'ihi na ọ nọ n'orù, ya na umu-ya.

26. Ma Jerusalem nke di n'elu nwere onwe-ya, ya onwe-ya bu kwa nne ayi.

27. N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si,Ka obi nātọ gi utọ, nwanyi-àgà nke nādighi-amu nwa;Tiwa nkpu ọṅù, ti kwa nkpu, gi onye ime nādighi-eme:N'ihi na umu nke nwanyi arapuru nání ya di ọtutu kari umu nke nwanyi ahu nwere di.

28. Ma ayi onwe-ayi, umu-nnam, bu umu nke nkwa, dika Aisak.

29. Ma dika onye amuru n'uzọ anu-aru sob͕uru onye amuru n'uzọ Mọ Nsọ mb͕e ahu, ọbuná otú a ka ọ di ub͕u a.

30. Otú ọ di, gini ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nēkwu? Chupu orù-nwanyi a na nwa-ya nwoke: n'ihi na nwa-nwoke orù-nwanyi agagheso nwa nke nwanyi ahu nke nwere onwe ya keta ihe.

31. N'ihi nka, umu-nnam, ayi abughi umu nke orù-nwanyi, kama ayi bu umu nke nwanyi ahu nwere onwe-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Galetia 4