Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Galetia 4:11-21 Bible Nso (IGBOB)

11. Anamatu egwu unu, ma o nwere uzọ ọ bula m'dọb͕uworo onwem n'ọlu n'aru unu n'efu.

12. Umu-nnam, ariọm unu, menu onwe-unu ka unu di ka mu onwem, n'ihi na mu onwem me-kwa-ra onwem ka m'di ka unu onwe-unu. Unu emeghm ajọ omume ọ bula:

13. ma unu matara na ọ bu n'ihi adighi-ike nke anu-aru ka m'zìri unu ozi ọma na mbu:

14. unu akpọghi kwa ihe di n'anu-arum nke bu ọnwunwa n'ebe unu nọ ihe-efu, ọ sọghi kwa unu oyi; kama unu naram nke-ọma dika mọ-ozi nke Chineke, dika Kraist Jisus.

15. Òle ebe ọ di kwa, bú ọkpukpọ unu nākpọ onwe-unu ndi ngọzi diri? n'ihi na ab͕aram unu àmà, na, ọ buru na ọ bu ihe unu puru ime, unu gāghuputawori anya-unu nyem.

16. Ya mere àghọwom onye-iro-unu, n'ihi na anamagwa unu ezi-okwu?

17. Ha were obi nānu ọku chọ unu n'uzọ nādighi nma; ma ha nāchọ imechibido unu uzọ n'èzí, ka unu we were obi nānu ọku chọ ha.

18. Ma ọ di nma ka ewere obi nānu ọku chọ unu n'ihe ọma mb͕e nile, ọ bughi kwa nání mb͕e m'nọ n'etiti unu.

19. Umu-ntakirim, unu ndi ime unu nēmem ọzọ rue mb͕e agēme ka udi Kraist di nime unu,

20. ọ gādim nọ̄ nma ma asi na apurum inọ n'etiti unu ub͕u a, na ib͕anwe olu m; n'ihi na enwerem obi abua n'ebe unu nọ.

21. Gwanum, unu ndi nāchọ inọ n'okpuru iwu, ùnu adighi-anu iwu ahu?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Galetia 4