6. Unu ekwela ka onye ọ bula were okwu efu rafue unu: n'ihi na ọ bu n'ihi ihe ndia ka iwe Chineke nābiakwasi umu nke ekwenyeghi-ekwenye.
7. Ya mere, unu esola ha kekọ ihe;
8. n'ihi na unu buri ọchichiri n'oge gara aga, ma unu bu ìhè ub͕u a nime Onye-nwe-ayi: nējegharinu dika umu nke ìhè
9. (n'ihi na nkpuru nke ìhè ahu di n'idi-nma na ezi omume na eziokwu nile),
10. nānwaputa ihe di Onye-nwe-ayi ezi mma;
11. unu esola ọlu nke ọchichiri nke nāmighi nkpuru nēnwekọ ihe, ma kama nke ahu nātu-kwa-nu ha nmehie-ha n'anya;
12. n'ihi na ọ bu ihe-ihere ọbuná ikwu okwu bayere ihe nile ha nēme na nzuzo.
13. Ma ìhè nēme ka ihe nile puta ìhè mb͕e anātu ha nmehie-ha n'anya: n'ihi na ihe ọ bula anēme ka ọ puta ìhè bu ìhè.
14. N'ihi nka Ọ si, Teta, gi onye nāraru ura, Si kwa na ndi nwuru anwu bilie, Kraist ahu gāmukwasi kwa gi.
15. Ya mere lezienu anya nke-ọma otú unu nējeghari, ọ dighi ka ndi nāmaghi ihe, kama dika ndi mara ihe;
16. nāzuchapuru onwe-unu oge a nile, n'ihi na ubọchi ndia jọrọ njọ.
17. N'ihi nka unu aghọla ndi nēnweghi uche, kama ghọtanu ihe bu ihe Onye-nwe-ayi nāchọ.
18. Unu aṅubiga-kwa-la manya ókè, nke ndu ila-n'iyì di nime ya, kama juputanu na Mọ Nsọ;
19. nēwere abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ gwarita onwe-unu okwu, nēwere obi-unu bù abù kpọ kwa ubọ nye Onye-nwe-ayi;
20. nēkele kwa Chineke, bú Nna, ekele mb͕e nile n'ihi ihe nile n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist;