isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Efesọs 5 Bible Nso (IGBOB)

1. Ya mere burunu ndi nēṅomi Chineke. dika umu ahuru n'anya;

2. nējeghari-kwa-nu n'ihu-n'anya, dika Kraist-ayi hu-kwa-ra unu n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihi ayi, dika ihe echere n'iru Chineke na àjà achuru nye Ya ka ọ buru isisì nke ihe ísì utọ.

3. Ma ikwa-iko, na adighi-ọcha nile, ma-ọbu anya-uku, ka aghara ikpọ ọbuná aha-ya n'etiti unu, dika o kwesiri ndi nsọ;

4. ma-ọbu ihe-ihere, ma-ọbu ikwu-okwu-nzuzu, ma-ọbu okwu nābaghi n'ihe, nke nēkwesigh: ma kama nke ahu ikele-ekele.

5. N'ihi na nka ka unu matara nke-ọma, na ọ dighi onye ọ bula nke bu onye nākwa iko, ma ọbu onye n-adighi ọcha, ma-ọbu onye-anya-ukwu, nke isi-ya bu onye nēkpere arusi, nwere ihe-nketa n'ala-eze nke Kraist na Chineke.

6. Unu ekwela ka onye ọ bula were okwu efu rafue unu: n'ihi na ọ bu n'ihi ihe ndia ka iwe Chineke nābiakwasi umu nke ekwenyeghi-ekwenye.

7. Ya mere, unu esola ha kekọ ihe;

8. n'ihi na unu buri ọchichiri n'oge gara aga, ma unu bu ìhè ub͕u a nime Onye-nwe-ayi: nējegharinu dika umu nke ìhè

9. (n'ihi na nkpuru nke ìhè ahu di n'idi-nma na ezi omume na eziokwu nile),

10. nānwaputa ihe di Onye-nwe-ayi ezi mma;

11. unu esola ọlu nke ọchichiri nke nāmighi nkpuru nēnwekọ ihe, ma kama nke ahu nātu-kwa-nu ha nmehie-ha n'anya;

12. n'ihi na ọ bu ihe-ihere ọbuná ikwu okwu bayere ihe nile ha nēme na nzuzo.

13. Ma ìhè nēme ka ihe nile puta ìhè mb͕e anātu ha nmehie-ha n'anya: n'ihi na ihe ọ bula anēme ka ọ puta ìhè bu ìhè.

14. N'ihi nka Ọ si, Teta, gi onye nāraru ura, Si kwa na ndi nwuru anwu bilie, Kraist ahu gāmukwasi kwa gi.

15. Ya mere lezienu anya nke-ọma otú unu nējeghari, ọ dighi ka ndi nāmaghi ihe, kama dika ndi mara ihe;

16. nāzuchapuru onwe-unu oge a nile, n'ihi na ubọchi ndia jọrọ njọ.

17. N'ihi nka unu aghọla ndi nēnweghi uche, kama ghọtanu ihe bu ihe Onye-nwe-ayi nāchọ.

18. Unu aṅubiga-kwa-la manya ókè, nke ndu ila-n'iyì di nime ya, kama juputanu na Mọ Nsọ;

19. nēwere abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ gwarita onwe-unu okwu, nēwere obi-unu bù abù kpọ kwa ubọ nye Onye-nwe-ayi;

20. nēkele kwa Chineke, bú Nna, ekele mb͕e nile n'ihi ihe nile n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist;

21. nēdorita onwe-unu n'okpuru ibe-unu nime egwu Kraist.

22. Ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di nke aka unu, dika n'okpuru Onye-nwe-ayi.

23. N'ihi na di bu isi nke nwunye, dika Kraist-ayi bu kwa isi nzukọ-Ya, ebe Ya onwe-ya bu Onye-nzọputa nke aru.

24. Ma dika anēdo nzukọ ahu n'okpuru Kraist-ayi, otú a ka ndi bu nwunye do kwa onwe-ha n'okpuru di-ha n'ihe nile ọ bula.

25. Ndi bu di, hunu nwunye-unu n'anya, dika Kraist-ayi hu-kwa-ra nzukọ-Ya n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihi ya;

26. ka O we do ya nsọ, mb͕e O mesiri ka ọ di ọcha site n'ọsisa miri n'okwu Chineke,

27. ka Ya onwe-ya we che nzukọ ahu n'iru Onwe-ya dika ihe di ebube, nēnweghi ntupọ ma-ọbu iru-ndọli ma-ọbu ihe ọ bula n'ihe di otú a; kama ka o we di nsọ buru kwa ihe anāpughi ita uta.

28. Otú a ndi bu di ji kwa ugwọ ihu nwunye nke aka ha n'anya dika ha huru aru nke onwe-ha n'anya. Onye nāhu nwunye nke aka ya n'anya nāhu onwe-ya n'anya:

29. n'ihi na ọ dighi onye ọ bula kpọrọ aru onwe-ya asì mb͕e ọ bula; kama ọ nāzù ya nēlezi kwa ya anya nke-ọma, dika Kraist nēme kwa nzukọ-Ya;

30. n'ihi na ayi bu ihe di n'aru-Ya.

31. N'ihi nka ka nwoke gārapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya; ha abua ewe ghọ otù anu-aru.

32. Ihe-omimi a di uku: ma mu onwem nēkwu okwu bayere Kraist baye-kwa-ra nzukọ-Ya.

33. Otú ọ di, unu onwe-unu n'otù n'otù hu kwa nwunye-unu n'anya, onye ọ bula ya hu nwunye nke aka ya n'anya, dika ọ nāhu onwe-ya n'anya; ka nwunye lezi kwa anya ka ọ nātu egwu di ya.