Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi Efesọs 4:1-14 Bible Nso (IGBOB)

1. Ya mere mu onwem, bú onye-nkpọrọ nime Onye-nwe-ayi, nāriọ unu ka unu jegharia dika o kwesiri ọkpukpọ nke akpọrọ unu,

2. n'obi di ume-ala na idi-nwayọ nile, n'ogologo ntachi-obi, nānagiderita ibe-unu nime ihu-n'anya;

3. nānu ọku n'obi idebe idi-n'otù nke Mọ Nsọ nime ihe-ọkiké nke bu udo.

4. Otù aru di, otù Mọ di kwa, dika akpọ-kwa-ra unu nime otù olile-anya nke ọkpukpọ-unu;

5. otù Onye-nwe-ayi di, otù okwukwe di, otù baptism di,

6. otù Chineke na Nna nke ayi nile di, Onye bu isi ayi nile, Onye site-kwa-ra n'aka ayi nile nālu ọlu, Onye nānọ kwa nime ayi nile.

7. Ma ọ bu ayi nile n'otù n'otù ka enyere amara ahu dika ọtùtù nke onyinye Kraist si di.

8. N'ihi nka Ọ si,Mb͕e Ọ rigoro n'elu, Ọ dọtara usu ndi adọtara n'agha n'agha,Nye kwa madu onyinye di iche iche.

9. (Ma okwu nka, Ọ rigoro, gini ka ọ bu ma-ọbughi na Ọ rida-kwa-ra nime akuku uwa dikariri ala?

10. Onye ridara bu kwa Onye ahu Nke rigoro n'ebe kachasi elu-igwe nile elu nke-uku, ka O we mezu ihe nile.)

11. Ya onwe-ya nye-kwa-ra ufọdu ka ha buru ndi-ozi; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi-amuma; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi nēzisa ozi ọma; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi nāzù aturu Chineke na ndi-ozizí;

12. ime ka ndi nsọ zu okè ilu ọlu nke ije-ozi, iwuli aru nke Kraist elu dika ulo:

13. rue mb͕e ayi nile gēru idi-n'otù nke okwukwe na nke nmazu nke Ọkpara Chineke, ru ibu nwoke tozuru okè, ru ọtùtù nke ogologo nke ozuzù nke Kraist:

14. ka ayi we ghara ibu umu ọhu ọzọ, ndi ifufe nile ọ bula nke ozizí nēfeghari nēbughari kwa, nime itu-ntu nke madu, nime aghughọ, nke ha ji ezuputa nduhie;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi Efesọs 4