Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 9:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. O we ba nime ub͕ọ, gabiga n'ofè ọzọ, bia n'obodo nke aka Ya.

2. Ma le, ha butere Ya onye akuku-aru-ya nwuru anwu, tọb͕ọrọ n'ihe-ndina: mb͕e Jisus huru okwukwe-ha Ọ si onye ahu akuku-aru-ya nwuru anwu, Nwa, nwe obi-ike; anāb͕aghara gi nmehie-gi nile.

3. Ma le, ufọdu n'etiti ndi-ode-akwukwọ kwuru nime onwe-ha, si, Nwoke a nēkwulu Chineke.

4. Ma Jisus, ebe ọ mara ihe nile di ha n'obi, Ọ si, Gini mere unu nēchè ajọ ihe n'obi-unu?

5. N'ihi na, òle nke ka nfe, isi, Anāb͕aghara gi nmehie-gi nile; ma-ọbu isi, Bilie, jeghari kwa?

6. Ma ka unu we mata na Nwa nke madu nwere ike n'elu uwa ib͕aghara nmehie (mb͕e ahu Ọ siri onye ahu ukwu-ya nwuru anwu), Bilie, chiri ihe-ndina-gi, la n'ulo-gi.

7. O we bilie, la n'ulo-ya.

8. Ma mb͕e ìgwè madu nile huru ya, ha turu egwu, we nye Chineke otuto, Onye nyere madu ike di otú a.

9. Mb͕e Jisus nēsi n'ebe ahu nāga, Ọ huru otù nwoke, anākpọ Matiu, ka ọ nọduru n'ulo-ùtú: Ọ si ya, Som. O we bilie, so Ya.

10. O rue, mb͕e Ọ nọduru na nri n'ulo-ya, le, ọtutu ndi-ọna-utu na ndi-nmehie biara so Jisus na ndi nēso uzọ-Ya nọdu na nri.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 9