Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 8:24-34 Bible Nso (IGBOB)

24. Ma le, oké ajọ ifufe febe n'oké osimiri, ya mere ebili-miri nēkpuchi ub͕ọ-ha: ma Ya onwe-ya nāraru ura.

25. Ha we biakute Ya, kpọte Ya, si, Onye-nwe-ayi, zọputa ayi; ayi nāla n'iyì.

26. O we si ha, Gini mere unu nātu ujọ, unu ndi okwukwe ntà? Mb͕e ahu O biliri, bara ifufe na oké osimiri ahu nba; oké ndaju we di.

27. Ibobo we nwua ndi ahu n'aru, ha si, Àha madu gini ka Onye a bu, na ọbuná ifufe na oké osimiri nāṅa Ya nti?

28. Mb͕e Ọ gabigasiri n'ofè ọzọ n'ala ndi Gadara, ndikom abua ndi mọ ọjọ ji we zute Ya, ndi nēsi n'ebe anēlì ozu puta, ndi anya-ha di oké egwu, ya mere ọ dighi onye ọ bula nwere ike igabiga uzọ ahu.

29. Ma le, ha tiri nkpu, si, Gini ka ayi na Gi nwekọrọ, Gi Ọkpara Chineke? Ì biara ebe a imekpa ayi aru mb͕e oge-ayi akērughi?

30. Ma ìgwè nke ọtutu ezì di n'ebe di anya n'ebe ha nọ, nāta nri.

31. Ndi-mọ ọjọ ahu we riọ Ya, si, Ọ buru na I chupuru ayi, ziga ayi nime ìgwè ezì ahu.

32. O we si ha, Labanu. Ha we puta, je ba n'ìgwè ezì ahu: ma le, ìgwè ezì ahu nile nudara n'ebe ahu di nkputankpu dabà n'oké osimiri, nwua nime miri.

33. Ndi nāzù ha we b͕alaga, we je ba n'obodo ahu, kọsa ihe nile, ya na ihe mere ndi ahu ndi-mọ ọjọ ji.

34. Ma le, obodo ahu nile putara izute Jisus: ma mb͕e ha huru Ya, ha riọrọ Ya ka Ọ pua n'ókè-ala-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 8